You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Bobrisky enwerela onwe ya site n'ụlọmkpọrọ dị na Legọs
Onye a ma ama na soshal midia bụ Okuneye Idris e ji Bobrisky maara esila n’ụlọmpkọrọ pụta dịka ọ na-achara ọnwa atọ.
Nwamadị a gbanwere ụdịdị ya ma na-emezi ka nwaanyị ka a tụrụ mkpọro ọnwa isii n’ọnwa Eprel maka ịmetọ akwụkwọ ego naịra mgbe ọ gara mmemme.
N’ihe onyonyo pụtara na soshal midia gosiri ka Bobrisky nọ n’ime ụgbọala ya na ndị enyi ya nwaanyị abụọ dịka ha na-agụ egwu na-eti “anyị apụtala”.
N’ime ụgbọala ahụ si n’ihu ụlọmkpọrọ Kirikiri dị n’Ikoyi Legọs na-apụta, Bobrisky kwuru “Ọ bụ m, nne ukwu nke Legọs, obi dị m ụtọ ịpụta, a gaghị echenwu ịgwa unu ihe ndị m jiri pụta.”
Bobrisky gara n'ihu dụọ ndị mmadụ ndụmọdụ ka ha ghara ịmetọsị akwụkwọ ego naịra bụ ihe e ji maka ya tụọ ya mkpọro.
Mpụta Bobrisky a ebutela ọtụtụ okwu na soshal midia dịka ọtụtụ ndị na-ajụ ma ọ bụkwa eziokwu na Bobrisky gara mkpọro?
Otu onye kwuru na ọ dịghị ka onye nọ n’ụlọmkpọrọ kamgbe ọnwa atọ, na ahụ dị ya mma nke ukwu.
Etu e si tụọ Bobrisky mkpọrọ ọnwa isii
Ụlọikpe ukwu dị na Legọs atụọla Idris Olanrewaju Okuneye onye a maara nke ọma dịka ‘Bobrisky’ mkpọrọ na-enyeghị ya ohere ịkwụ nha.
Ọkaikpe Abimbola Awogboro nke ụlọikpe ukwu Legọs tụrụ Bobrisky mkpọrọ ọnwa isii bụ onye nọ n’ụlọnga kemgbe izuụka gara aga.
Ọ bụ n’abalị 5 nke ọnwa Eprel afọ 2024 ka ụlọọrụ Naịjirịa na-ebu agha megide mpụ na nrụrụakaego bụ ‘Economic and Financial Crimes Commission’ (EFCC) kpọpụrụ Bobrisky n’ụlọikpe ukwu dị na Legọs n’ihi ebubo ịmetọ akwụkwọ ego Naịra.
Ọkaikpe nke ụlọikpe ahụ bụ Abimbola Awogboro nọọrọ n’ụbọchị ahụ maa Bobrisky ikpe maka ịmetọ akwụkwọ ego Naịra.
O nyere iwu ka a kpọchie Bobrisky n'ụlọnga EFCC ruo n’abalị 9 nke ọnwa Eprel bụ mgbe ọ ga-ekwupụta ntaramahụhụ ya.
Tupu a maa ya ikpe, Bobrisky rịọrọ ụlọikpe ahụ arịrịọ na ọ maghị maka iwu gbasara mmetọ akwụkwọ ego Naịra.
Ọ rịọrọ ka ụlọikpe ahụ gbaghara ya ma kwee nkwa na ọ ga-eme ka ndị mmadụ mara na ọ dịghị mma imetọ akwụkwọ ego naịra.
Ihe a bụ ugboro abụọ a na-ama mmadụ ikpe maka ịmetọ akwụkwọ ego Naịra.
Nke mbụ mere n’ọnwa Febụwarị 2024 bụ mgbe a mara otu nwaanyị na-eme ejije ‘Nollywood’ bụ Oluwadarasimi Omoseyin onye a na-etu ‘Simi Gold’ ikpe maka ịmetọ akwụkwọ ego Naịra n’oge ọ na-agba egwu na mmemme agbamaakwụkwọ enyi ya na Lekki dị na Legọs Steeti.