Anyị nwuchiri ụfọdụ ndị 'Yoruba Nation' wakporo ụlọọrụ anyị na Legọs Steeti taa - Ndị uweojii

Ndị uweojii Oyo steeti esitela n'ọnụ na-ekwuchitere ha bụ Osesifo Adewale kwuo sị na ha anwuchiela mmadụ ise ha na-enyo enyo ha kpọrọ ndị otu 'Yoruba Nation' maka iwakpo ụlọ mgbasaozi redio nke 99.1fm, Moniya, Ibadan taa bụ ụbọchị 29 nke ọnwa mee afọ 2023.

N'aka nke ọzọ ka ndị uweojii nke Legọs steeti depụtakwara n'akara twitter ha ma sịkwa na ndị a wakporo ụlọọrụ ndị uweojii dị n'Alausa na steeti ahụ n'ihe dịka elekre 05:35 nke ụtụtụ na-eti mkpụ sị, " Mba Yoruba na-achịzị ugbua" n'otu ụbọchị a.

Ha kwuru na ndị a merụrụ ụfọdụ ndị uweojii ahụ, ebe ha nwuchiri mmadụ abụọ kama ndị nke ọzọ riri mbọmbọ ọsọ.

Ha kwuru na nyocha ha gosiri na n'ihe dịka elekere 6:00 nke ụtụtụ ka ha natara ozi na ndị omekome na-awakpo ụlọ mgbasaozi redio nke 99.1 fm.

Dịka ndị uweoji siri kwuo na ndị a sị na ha bịara ịgwa ndị uweojii na ngalaba United Nations enyela ikike ka ehiwe mba Yoruba.

Osesifo depụtara sị na ha napụtara ndị a ọgwụ odeshi ma sịkwa na otu n'ime ha bụ nwaanyị.

Ha kwuru na enweghị onye ọrụ ụlọ mgbasaozi a merụrụ ahụ.

N'aka nke ọzọ ka onye na-ekwuchitere otu Yoruba Nation bụ Koiki depụtara na ndị a ndị uweojii jidere abụghị ndị otu Yoruba Nation.