Ihe akaebe gosiri na e ji ogbunigwe 'drone' ndị Iran na UAE alụ agha na Sudan

Ebe foto si, Reuters
- Onye dere ya, Abdelrahman Abu Taleb
- Ndị mere akụkọ a, BBC News Arabic
- Ebeg o si, Cairo
A na-ebo mba Iran na mba United Arab Emirates ebubo imetọ mmachi iwu nke otu mbaụwa UN site n'inye ụgbọelu agha n’aka ndị na-alụ ọgụ ihe ruru ọnwa 14 nke mebiri Sudan. Anyị na-enyocha ihe akaebe iji kwado nkwupụta ahụ.
N'ụtụtụ 12 Maachị afọ 2024, ndịagha gọọmentị Sudan nọ na-eme mmemme mmeri n’agha ha na-enwetụbeghị ụdị ya. Ha eweghachila isi ụlọọrụ mgbasa ozi steeti ahụ dị n’isi obodo Khartoum.
Dị ka ọtụtụ obodo ahụ, ụlọ ahụ dabara n'aka ndịagha Rapid Support Forces (RSF) na mmalite agha obodo nke mere n’ọnwa 11 gara aga.
Ihe a ma ama banyere mmeri ndịagha a bụ na vidiyo gosiri na e ji enyemaka ndị Iran mee mwakpo ahụ.
A hụrụ ogbunigwe 'Drone'
Suliman Baldo, onye nduzi nke 'Sudan Transparency and Policy Observatory' kwuru na mmalite agha ahụ, ndịagha Sudan dabere na ndịagha ikuku.
"Ndịagha ahụ hụrụ na a nochibidoro ndịagha ha niile, ha enweghị ndịagha ọbụla n'ala."
Ndị RSF nọgidere na-achịkwa ala nke ọtụtụ ndị Khartoum na Darfur dị na ọdịda anyanwụ Sudan, ebe SAF nọgidere na mbara igwe.
Ka ọ na-eru mbido ọnwa Jenụwarị 2024, ihe onyonyo pụtara na Twitter gosiri ụgbọelu agha ndị RSF gbaturu.
Dị ka Wim Zwijnenburg si kwuo, onye ọkachamara ngwa agha drone na onyeisi 'Humanitarian Disarmament Project' nke 'Dutch Peace Organization PAX', mkpọmkpọ ya, injin ya na ọdụ ya yiri ụgbọmmiri nke Iran mepụtara nke a na-akpọ Mohajer-6.
Mohajer-6 dị mita 6.5 n'ogologo, o nwere ike ịgbago ruo 2,000km ma rụọ ọrụ agha dị egwu.

Ebe foto si, Planet Labs
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Zwijnenburg chọpụtara ụdị ogbunigwe drone ọzọ na onyonyo satịlaịtị nke ndịagha Wadi Seidna, dị na ugwu Khartoum, ewepụtara ụbọchị atọ ka e mesịrị.
Zwijnenburg na-ekwu, "ogbunigwe Drones ndị a nwere ike ukwuu n'ihi na ha nwere ike ịchọpụta ihe zoro ezo."
Ka izu atọ gachara ka agbagburu Mohajer-6, vidiyo pụtara nke gosiri ogbunigwe drone ọzọ nke RSF gbaturu.
Dịka nchọpụta BBC na PAX siri kwuo, ejirila ụgbọelu Zagjil-3 eje agha na Sudan ihe ruru ọtụtụ afọ. Mana ọ bụ n’ọnwa Jenụwarị bụ mbụ ha ji ya lụọ agha.
N'ọnwa Maachị, Zwijnenburg chọpụtara otu ụdị Zajil-3 site na onyonyo satịlaịtị nke Wadi Seidna.
"[Ọ bụ] ihe na-egosi nkwado ndị Iran na-enye ndịagha Sudan,", ọ bụ ezie na ndị isi ọchịchị Sudan gọnarịrị inweta ngwá agha n'aka Iran.
Zwijnenburg kwuru na, "Ọ bụrụ na ụgbọelu ndị a nwere akụrụngwa dị iche iche, ọ pụtara na ọ bụ Iran nyere ha ya n'ihi na anaghị emepụta ngwa agha ndị ahụ na Sudan."
Na mbido Disemba, ụgbọelu njem Boeing 747 nke na-ebu ibu ọ bụ Iran Qeshm Fars Air nwe, fepụrụ na ọdụ ụgbọelu Bandar Abbas dị na Iran, gawa n'Oké Osimiri Uhie tupu ọ pụọ n'ihe nhụta radar.
Mgbe awa ole na ole gachara, satịlaịtị gosiri ihe onyonyo nke otu ụgbọelu dị na ọdụ ụgbọelu dị na Port Sudan dị n'akụkụ ọwụwa anyanwụ nke mba ahụ, ebe ndị isi ndịagha Sudan nọ.
Foto nke otu ụgbọelu dị n'okporoụzọ ụgbọelu mechara kesaa na Twitter.

Ebe foto si, X @SudanSena
Ụgbọelu a rụrụ ọrụ ugboro ise ruo na njedebe ọnwa jenụwarị, n'otu ọnwa ahụ ka edere maka ụgbọelu Iran.
Qeshm Fars Ikuku na-eche mmachi US n'ihi ọtụtụ ebubo ebubo ibufe ngwa ọgụ na ndịagha na gburugburu Middle East, ọkachasị na Syria, otu ndị ha na Iran na-arụ ọrụ.
Akụkụ ọbụla nwere ebumnobi ya
Sudan na ndịagha Iran nwere mmekorita tupu mmekọrịta ahụ akwụsi n’afọ 2016 n'ihi esemokwu dị n'etiti Saudi Arabia na Iran, nke Sudan kwadoro Saudi Arabia.
Suliman Baldo kwuru, "Ọtụtụ ngwa agha ndị Sudan bụ ụdị nke ndị Iran mepụtara.
Kemgbe mmalite esemokwu dị ugbua, gọọmentị Sudan eweghachitela mmekọrịta ya na Tehran.
Dị ka Baldo si kwuo, akụkụ ọ bụla nwere ebumnobi ya.
"Iran na-achọ ebe mgbado ụkwụ na mpaghara ahụ. Ọ bụrụ na ha chọta ohere, ha ga-enye ha ọtụtụ ngwa agha drones dị elu.
BBC kpọtụrụ ndịagha Sudan, Mịnịstrị na-ahụ maka mba ofesi nke Iran na Qeshm Fars Air ka ha kwuo maka ebubo na a na-eji ụgbọelu drones Iran anụ ọgụ ahụ mana ha enwetaghị azịza.
Mana na mkparịtaụka ya na BBC gbara, Malik Agar, osote onyeisioche ndị otu ọchịchị Sudan kwuru, sị: "Anyị anaghị enweta ngwa ọgụ ọ bụla n'aka ndị otu ọ bụla… Ngwá agha dị na ahịa ojii".

Ebe foto si, @RapidSupportSdn
A hapụrụ mmachi ngwa agha nke UN tinyere
Ka ọ dị ugbua, ihe akaebe pụtara na mbido agha ahụ na RSF na-eji ụgbọelu quadcopter nke nwere ike ịtụba ogbunigwe 120mm.
Foto na onyonyo pụtara na soshal midia gosiri na ndịagha agbagburu ọtụtụ ụgbọelu ndị a.
Brian Castner, onye ọkachamara ngwa agha na Amnesty International, na-atụ aka na ọ bụ aka UAE dị na ya.
"UAE na-enye ndị otu ya otu ugbọelu drones na mpaghara esemokwu ndị ọzọ dị ka Ethiopia na Yemen."

Ebe foto si, X @war_noir
Dị ka akụkọ otu mbaụwa UN gosipụtara na Security Council na mbido afọ a, ndị ọkachamara na-ahụ maka ụgbọelu hụrụ ụgbọelu nke eboro ebubo na ọ na-ebuga ngwa agha site na UAE gawa RSF - ebubo nke UAE gọnarịrị.
Akụkọ UN kwukwara na ndị obodo na otu ndịagha na-akọ na ụgbọ ala bu ngwa agha na-ebufe n’ụgbọelu n'ọdụ ụgbọelu Amdjarass ọtụtụ ugboro n'izu, tupu ha aga Darfur na mpaghara Sudan ndị ọzọ.
Baldo kwuru "UAE nwekwara mmasị akụnaụba na Sudan ma na-achọ ebe mgbakwasị ụkwụ na Oké Osimiri Uhie."
UAE agọnarị ugboro ugboro na ụgbọelu ndị a ebula ngwa ọgụ, na-ekwu na ha na-ebuga enyemaka mmadụ ka ha na-ebu. Na nkwupụta, otu onye ọrụ gọọmentị gwara BBC na UAE na-agba mbọ ịchọ "Udo maka esemokwu na-aga n'ihu".
Ndị RSF azaghị arịrịọ BBC maka ikwu okwu.
" Castner kwuru na “Ụlọọrụ na-ahụ maka nchekwa ga-arụ ọrụ ịme ka udo naghachite n’ihi na ọnụ ọgụgụ ndị e gburu a kariala tinyer mmachi ngwa agha na Sudan niile."
Ihe ebube ị dị ndụ
Kemgbe a hụrụ ụgbọelu drones na mbara igwe Sudan, ọnọdụ agbanweela n’akụkụ ụfọdụ.
Ndị agha Sudan ejirila ike mebie nnọchibido a manyere ndịagha ha n'ọtụtụ ebe.
Ndị RSF apụọla na mpaghara ụfọdụ dị na ọdịda anyanwụ nke isi obodo ahụ.
Dị ka Suliman Baldo si kwuo, mgbanwe a bụ maka ụgbọelu drone ndị Iran.
Mgbe ihe karịrị otu afọ agha gasịrị, egbuola ihe ruru 16,650, dị ka Armed Conflict Location & Event Data Project (ACLED) si kwu.
Òtù Mbaụwa na-ahụ maka migration (IOM) na-ekwu na nde mmadụ 12million apụọla n'ụlọ ha.
Abdullah Makkawi bụ onye gbagara Ijipt ugbu a.
Mgbe ọ ka nọ na ndịda Khartoum na Julaị gara aga, ọ na-ekwu na ọ gbanarịtị ọnwụ mgbe ụgbọelu drones nke ndị RSF wakporo ha.
"M gbabara n'ụlọ... Nne m, na ụmụnne m anọ zoro n'okpuru akwa."
Abdullah kwuru na ha nụrụ ụda mgbọ drone dara n'ime ụlọosisi dị ha n’akụkụ.
“A sị na anyị nọ n'ọnụ ụlọ nke ọzọ, ọ gaara igbu anyị niile. Anyị dị ndụ taa bụ ọrụ ebube.”
Ná mmalite nke 2024, esemokwu ahụ gbasara na mpaghara ọhụrụ na-abụghị isi obodo. A kọrọ akụkụ ọnwụ ndị mmadụ sitere na mwakpo drone nke mere na ugwu, ọwụwa anyanwụ na etiti Sudan.
Tupu ọ gbaga Ijipt, Abdullah hapụrụ ezinụlọ ya na Port Sudan dị n'Ebe Ọwụwa Anyanwụ, na-ewere ya dị ka ebe dị nchebe. Mana ugbu a ọ na-atụ egwu na ụgbọelu drones nwere ike rute ebe ha nọ.
“Agha ahụ agwụla ndị Sudan ike. Naanị ihe anyị chọrọ bụ ka agha kwụsị. Ọ bụrụ na mba ọzọ akwụsị iji ngwa agha na-akwado akụkụ abụọ ahụ, ọ ga-akwụsị.









