You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ikpe a mara Nnamdi Kanu dị njọ - Aloy Ejimakor
E kwesịghị inwuchi Nnamdi Kanu na mbụ ka ọ fọdụzie ịtụ ya nga mkpụrụọka - Peter Obi
Peter Obi bụ onye ji aha Labour Pati zọọ ọkwa Onyeisiala Naịjirịa n'afọ 2023 etinyela ọnụ n'ikpe a mara Nnamdi Kanu, onyendu Ipob.
N'ozi o wepụtara n'akara soshal midia, Obi kwuru na ikpe a mara Kanu na-abịa n'oge Naịjirịa nọ n'ezigbo nsogbu akụnaụba na nchekwa, kama gọọmentị ga-eme ka obi kụjụọ ndị mmadụ, na ihe mere nwereike ikpalikwu iwu ndị mmadụ.
Obi sị na "Ekwuola m ya na e kwesighi inwuchi Kanu na mbụ, inwuchi na ikpe a mara ya gosiri na gọọmenti amaala afọ n'ala na-aghọtaghị ihe bụ nsogbu ndị mmadụ.
"Akpọọla m oku ọtụtụ ugboro ka e were mkparịtaụka udo, ịchịkọta mmadụ niile ọnụ iji nwete udo ga-adịgide. Na iji aka ike ga-abụ ihe ikpeazụ a ga-eme ma ọ bụrụ na e meela ihe ndị ọzọ. N'ebe okwu Kanu nọ, echeghi m na gọọmenti mere ihe ha kwesịrị ime."
O kwuru na ihe ndị Kanu na-achọ abụghị ihe a hụtụbeghi na mbụ, na ọ bụghị nsogbu na-enweghi ogbugbo kama na ọ bụ naanị amamihe ka e ji eso ya. Na ọ bụrụ n'obodo na-arụ ọrụ na mkpesa ndị ahụ kwesịrị ka e were mkparịtaụka so ya.
Obi gara n'ihu kwuo na etu gọọmenti si mee n'ikpe Kanu dịka "nwoke dabara n'ime olulu kama ọ ga-achọ ụzọ ịpụta, ọ gaa n'ihu na-egwu olulu ahụ." Na nke a ga-eme ka nsogbu gọọmenti kawanye njọ.
N'ikpeazụ, Obi kpọrọ oku ka e soro ụzọ mkparịtaụka udo site n'ọnụ ndị ọnụ na-eru n'okwu na Naịjirịa mee ka udo na ịhụnanya chịa na-agbanyeghi etu obi dị ndị mmadụ ugbua n'etu ụlọikpe si kpee ikpe ahụ.
Ihe Abaribe, Ben Kalu, Bianca na ndị ọzọ kwuru banyere ikpe a mara Kanu
Kemgbe Ọkaikpe James Omotosho nke ụlọikpe Ukwu Etiti dị n'Abuja mara Mazi Nnamdi Kanu ikpe maka ebubo iyi ọha egwu Gọọmenti Etiti boro ya, ọtụtụ mmadụ ọkachasị ndị a ma ama akatọla mkpebi ahụ nke tụrụ Kanu mkpọrọ ọka.
Sinetọ Enyinnaya Abaribe na-anọchiteanya Abia Saụt n'Ụlọomeiwu Ukwu Naịjirịa a katọrọ mkpebi ụlọikpe ahụ ma kọwaa ya dịka ihe gosiri oke mkpagbu ndị si mpaghara Ọwụwa Anyanwụ na Naịjirịa n'ikpe ziri ezi.
Ikpe a mara Kanu gosiri na a na-akpachapụ ndị Igbo- Abaribe
N'akwụkwọ mgbasaozi nke Abaribe na-anọchiteanya Abia Saụt n'Ụlọomeiwu Ukwu Naịjirịa wepụtara ụbọchị Tozde, o kwuru sị, "Ihe ụlọikpe ahụ kpebiri n'isi Nnamdi Kanu bụ iji kpagbuo nwaamadị ahụ. Ọ bụ ihe jọgburu onwe ya na ndị mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa anaghị enweta ikpe ziri ezi."
Ọ gara n'ihu kwuo na gọọmenti Naịjirịa enyela ndị omekome na-eyi ọha egwu si mpaghara ugwu nakwa mpaghara Saụt Saụt mgbaghara ma nye ha ọrụ dị iche iche mbụ ma kwuo na ya amaghị ihe mere okwu Nnamdi Kanu ji di iche. O mere ka o doo anya.
Sinetọ Abaribe kwuru na ndị igbo agbaala mbọ iji hụ na-ewetara ezi ndozi n'ikpe ahụ mana ka ọ dị ugbua, ha amaghịzi ihe ha ga-eme.
N'ikpeazụ, Sinetọ Abaribe kwuru na o nwere olileanya na Onyeisiala Bola Tinubu ga-etinye anya n'okwu Nnamdi Kanu iji hụ na e nwere udo, ịdị n'otu nakwa ọgannihu n'Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa.
Olileanya ka dị na Nnamdi Kanu ga-enwere onwe ya - Benjamin Kalu
Osote Onyeisi Ulọomeiwu Nnọchiteanya bụ Benjamin Kalu kwupụtara olileanya na a ga-atọhapụ Nnamdi Kanu site n'usoro mkparịtaụka ndọrọndọrọ ọchịchị a kpọrọ 'political solution'.
Kalu kwuru nke a n'ozi odeakwụkwọ mgbasaozi ya bụ Levinus Nwabughiogu wepụtara n'ụbọchị Tọzde 20 Novemba 2025 dịka Ọkaikpe James Omotosho nke Ụlọikpe Ukwu Etiti dị n'Abuja machara Kanu ikpe ma tụọ ya mkpọrọ ahụ.
Ọ sịrị na ha na-agbasi mbọ ike ịhụ na e ji usoro mkparịtaụka ndọrọndọrọ ọchịchị a mee ka onyendu Ipob nwere onwe ya.
Kalu gosiri olileanya na Onyeisiala Tinubu ga-ege ntị n'arịrịọ ndị Igbo nwere agba na-arịọ ya ma tọhapụ Kanu.
Ọ gwara ndị Igbo na ụmụafọ Naịjirịa niile ka ha dere duu, ma kwe ha nkwa na olileanya ka dị.
Otu 'South East Governors Forum' ga-elebanye anya n'ikpe Nnamdi Kanu - Sinetọ Uche Ekwunife
Oge anyị kpọtụụrụ Sinetọ Uche Ekwunife iji nweta ọnụ mmiri okwu ya banyere ikpe ahụ, o kwuru na Nnamdi Kanu bụ onye bara oke uru n'ala Igbo niile, ọ bụ onye a hụrụ n'anya nke ukwuu.
"Otu jikọrọ ndị Gọvanọ Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa ga-elebanye anya n'ikpe ahụ iji mara ihe a ga-eme maka ikpe ahụ. Ọzọ bụ na anyị ga-akpọtụrụ ndị ọkaiwu isi kara aka iji nweta ntụziaka tupu ikpe ahụ agaa ụlọikpe mkpegharị."
O kwuru na e jikwa usoro ndọrọ ndọrọ lebanye anya n'ikpe Nnamdi Kanu iji hụ na a tọhapụrụ ya.
N'aka nke ọzọ, Sinetọ Ekwunife kwuru na ọ dị mkpa ka gọọmenti gbaa mbọ nwụchie ndị omekome na ndị ojiegbe na-egbu ma na-atọrọ ọtụtụ ụmụakwụkwọ na mpaghara ugwu Naịjirịa iji hụ na e nwere ezi udo na Naịjirịa.
Tinubu agaghị eweta vootu n'Ọwụwa Anyanwụ ma ọ bụrụ na a tọhapụghị Nnamdi Kanu - Cubana Chiefpriest
Onye ji ego achụ ego a ma ama bụ Pascal Chibuike Okechukwu a maara dị Cubana Chiefpriest kwuru na ikpe ahụ a mara Nnamdi Kanu bụ ihe jọgburu onwe ya.
"Kemgbe Nnamdi Kanu nọ na nga, o wetara ajọ ọnọdụ nchekwa na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ niile n'oke nsogbu, ọtụtụ mmadụ nwụrụ, o metụtakwara ọtụtụ ụlọ obibi na ụlọọrụ dị iche iche. Nke ka njọ bụ na ụfọdụ n'ime anyị enweghị ike ịla n'obodo maka egwu ndị omekome na-akpa mkpamkpa na be anyị."
Cubana Chiefpriest kwuru na Onyeisiala Tinubu agaghị enweta vootu ruru 10,000 na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa na ntuliaka 2027 ma ọ bụrụ na ọ tọhapụghị Nnamdi Kanu.
Ọ gara n'ihu kpọọ oku ka ndị ọchịchị, ndị Gọvanọ nakwa ndị ọnụ na-eru n'okwu na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa ka ha tinye ọnụ n'okwu a iji hụ na Nnamdi Kanu nweere onwe ya. Okwuru na ọ bụ nke ga-eweta udo n'ala Igbo niile.
Ọ bụghị mkpebi anyị tụrụ anya ya - Bianca Ojukwu
Mịnịsta nta na-ahụ maka mmekọ mba ofesi bụ Bianca Ojukwu kwuru na mpụtara ikpe Nnamdi Kanu abụghị ihe a tụrụ anya ya ma kpọọ oku ka onye ọbụla ghara ime ihe nwereike ịkpalite ọgbaaghara n'obodo.
Ozi o wepụtara n'akara Instagram mere ka a mara na ugbua bụ oge ndị ọnụ na-eru n'okwu n'ala igbo, ndị azụmahịa, ndị Gọvanọ, ndị ụkọchukwu, ndị Eze ọdịnala na ndị ntorobia ga-etinye anya na mmiri ma chepụta usoro ka mma iji hụ na ha na gọọmenti nwere mkparịtaụka banyere etu Nnamdi Kanu ga-esi nwere onwe ya.
O kwuru na atụmatụ tigbuo zọgbuo enweghị uru ọbụla ọ ga-aba kama na ọ bụ naanị mkparịtaụka ga-eme ka okwu a wee isi.
Nye Nnamdi Kanu mgbaghara - Okon
Nwafọ Akwa Ibom Steeti na-eme ejije bụ Ime Umoh e ji Okon maara ji akara soshal mịdịa ya kwuo na-enweghị ihe ọhụrụ maọbụ ihe ịtụnanya dị n'ikpe Nnamdi Kanu.
Ọ sị na mkpebi Ọkaikpe James Omotosho nyere bụ ihe a na-atụ anya ya ma sị "ugbua a mara ya ikpe, anyị enwereike itinye anya n'ihe ọzọ dị mkpa: iji mgbaghara nke Onyeisiala na-enye".
Okon jụrụ ajụjụ sị "Ebe ndị na-eyi ọha egwu si mpaghara ugwu Naịjirịa a sị na ha 'chegharịrị' nwere ike inweta mgbaghara, ma tinye ha n'ime ngalaba nchekwa Naịjirịa dị oke mkpa dịka ndịagha, e kwesiri imere Nnamdi Kanu ya".
Ọ gwara Onyeisiala na ọ maara na o nwereiki ime ya.
Nchịkọta nkọwa ikpe Nnamdi Kanu
Kamgbe Ọkaikpe James Omotosho mara Nnamdi Kanu ikpe ma nye ya ntaramaahụhụ i bị ndụ ya niile n'ụlọmkpọrọ, ndị mmadụ ebidola itinye ọnụ n'okwu ahụ.
Gọọmenti etiti Naịjirịa boro Nnamdi Kanu ebubo dị iche iche gụnyere iyi ndụ egwu ma kpụpụ ya n'ụlọikpe. Ntaramahụhụ kachasị ukwuu ma ọ bụrụ ma mmadụ daa iwu n'ebubo ahụ bụ ọnwụ.
Ọkaikpe James Omotosho bidoro ikpe Nnamdi Kanu n'abalị iri abụọ na otu nke ọnwa Maachị, 2025 iji leba anya n'ebubo asaa ahụ Gọọmenti Naịjirịa boro ya.
Cheta na ọ bụ Ọkaikpe Binta Nyakọ jibu ikpe ahụ tupu Nnamdi Kanu ebo ya ebubo ma gwa ya wezuga onwe ya n'ikpe ahụ.
Binta Nyako wezugara onwe ya tupu ọkaikpe kachasị nke Naịjirịa bụ John Tsoho ewere ikpe ahụ tinye n'aka Ọkaiwu James Omotosho.
Ebubo asaa e boro Nnamdi Kanu
Tupu ụlọikpe amaa Nnamdi Kanu ikpe ma tụọ ya nga mkpụrụọka, lee ebubo asaa ndị ahụ Gọọmenti Naịjirịa boro ya:
Ebubo nke Mbụ:
Na Nnamdi Kanu, onye Afaraukwu, Ibeku Umuahia nke Okpuruọchịchị Abia-North bụ onye ndu otu Indigenous People of Biafra nọrọ n'etiti 2021 na 2015 na London, mba Briten, gbasaa ozi site na Radio Biafra nke e gere n'Enugwu na ebe ndị ọzọ na Naijiria ma kọwapụta nkwado ya na ndị ọzọ na-achọ achọ ka steeti dị n'Ọwụwa Anyanwụ nakwa Ndịda-ndịda (South-South) nakwa nkwa Kogi na Benue kewapụ na Naijiria ma bụrụ mba Biafra nke bụ mpụ megidere akụkụ iwu 41c nke Naịjirịa afọ 2004.
Ebubo nke abụọ:
Na Nnamdi Kanu site n'ozi ọ gbasara na Radio Biafra n'abalị 28 nke ọnwa Eprelụ afọ 2015, nke e gere n'Enugwu na mpaghara ndị ọzọ dị na Naijiria kpọọ Onyeisiala Majọ Generalụ Muhammadu Buhari "onye na-emetọ ụmụaka"(paedophile)", onye na-eyi ndụ egwu (terrorist), "anụ ọhịa" (idiot), nke bụ okpotokpo asị ma bụrụ mpụ megidere akụkọ iwu 375 nke ala Naijiria.
Ebubo nke Atọ:
Na Nnamdi Kanu n'ọnwa Maachị na Eprelụ afọ 2015 tụbatara na Naijiria ma dobe n'Ubulusiuzor dị n'Okpuru Ọchịchị Ihiala dị n'Anambara steeti, igwe mgbasaozi redio a kpọrọ "TRam 50L" nke o zoro na kọntena sị na ọ bụ ngwa e ji ebi ụlọ nke megidere akụkọ 47 iwu mpụ Naijria nke afọ 2004.
'Na gị bụ Nnamdi Kanu, kwuru na ịbụ onye otu 'Indigenous People of Biafra', otu a machiri amachi ma site n'otu a daa Akụkụ 16 nke iwu megidere iyi ndụ egwu nke afọ 2013."
Ebubo nke Ise:
Na Nnamdi Kanu site n'ozi ọ gbasara na Radio Biafra n'abalị 22 nke ọnwa Eprelụ afọ 2021 nke e gere n'Enugwu na mpaghara ndị ọzọ dị na Naijiria kpalite ndị otu Indigenous People of Biafra, (Ipob) bụ otu a machiri amachi ka ha malite iyi ndụ egwu egwu site na ịchụwa ndị ọrụ nchekwa na ndị ezinaụlọ ha nke megidere Akụkụ nke Mbụ mpaghara Abụọ N'Iwu megidere iyi ndụ egwu nke afọ 2013.
Ebubo nke Isii:
Na Nnamdi Kanu nọrọ n'abalị 16 nke ọnwa Mee afọ 2021 n'ịga n'ihu na ịda iwu megidere iyi ndụ egwu kwuru na mgbasaozi o mere site na Londo sị "N'izuụka abụọ, ihe ga-eme ga-ama ụwa jiji, ndị mmadụ ga-anwụ, ụwa gbaa gburu gburu ga-akwụrụ jụụ, kaa ihe a m kwuru n'aja." site na nke a daa Akụkụ Mbụ, mpaghara Abụọ n'Iwu megidere iyi ndụ egwu nke afọ 2013.
Ebubo nke Asaa:
Na Nnamdi Kanu nọrọ n'abalị 31 nke ọnwa Mee, gaa n'ihu n'imebi iwu megidere iyi ndụ egwu site na ịgbasa ozi na onye ọbụla esonyeghị n'oku nọrọ n'ụlọ "dee akwụkwọ ike ekpe ya" nke mere na ụlọakụ, ụlọakwụkwọ, ahịa, ọdọahịa, ọdọ mmanụ ụgbọala emepeghị nke a na-enwe ngagharị ụgbọala nke megidere Akụkọ Mbụ, mpaghara Abụọ nke Iwu Megidere iyi ndụ egwu nke afọ 2013.
Ọkaikpe James Omotosho tụrụ Nnamdi Kanu nga ebighiebi kama ịma ya ikpe ọnwụ
Ọkaikpe James Omotosho nke ụlọikpe dị elu n'Abuja atụọla Nnamdi Kanu bụ onye ndu otu Indigenouse People of Biafra (IPOB) nga i bi ndụ ya niile n'ime ụlọ mkpọrọ dịka ọ machara ya ikpe n'ebubo asaa gọọmenti etiti Naịjirịa boro ya.
Ọkaikpe Omotosho gụpụtara mkpebi ụlọikpe nke a n'oge ọ na-enye Nnamdi Kanu ntaramaahụhụ.
Mkpebi na ntaramaahụhụ ndị ọzọ Ọkaikpe Omotosho nyere Nnamdi Kanu gunyere ịnọ afọ iri abụọ n'ụlọ mkpọrọ maka ikpe mara ya n'ebubo nke atọ, ị nọ afọ ise n'ụlọ mkpọrọ maka ikpe mara ya n'ebubo nke asaa.
Ọ sị na Nnamdi Kanu ga-anọzu afọ ndị ahụ n'ụlọmkpọrọ na-enweghị ohere ijiri ego gbara isi onwe ya.
Ụlọikpe kwukwara na-agaghị ekwe ka Nnamdi Kanu bịa nso n'akụrụngwa nkanụzụ ọbụla ma ọ bụrụ na onye ndụmọdụ pụrụiche n'ihe gbasara nchekwa Naịjirịa adịghị ege ntị mara ihe o ji akụrụngwa ahụ na-eme.
Ọ sị na a ga-entinye Nnamdi Kanu n'ụlọ mkpọrọ ebe a ga-ejichi ya nke ọma.
Ọ sị na gọọmenti Naịjirịa ga-enwere akụrụngwa (Transmitter) o ji agbasa ozi Radio Biafra.
"Anyị ga-ebuga ikpe Nnamdi Kanu gaa ụlọikpe mkpesa" Maxwell Okpara
Ka a pụtara n'Ụlọikpe Ukwu dị n'Abuja Ọkaiwu, Maxwell Okpara gwara ndị ntaakụkọ na ha ga-aga ụlọikpe mkpesa ịkpegharị ikpe Nnamdi Kanu.
Alloy Ejimakor sị na nke a bụ mbụ ọ ga-ahụ na a na-ama mmadụ ikpe maka okwu ọnụ ya sọọsọ.
Mbido na mkpebi ikpe Nnamdi Kanu n'ikpe azụ a
Ọkaikpe James Omotosho bidoro ikpe Nnamdi Kanu n'abalị iri abụọ na otu nke ọnwa Maachị, 2025.
N'ọnwa Oktoba 2025 ka ụlọikpe gwara Nnamdi Kanu ka o bido usoro ịzara ọnụ ya ugboro ole ma ole mana okweghị.
Nnamdi Kanu kwuru na iwu e ji ekpe ya ikpe adịghị n'akwụkwọ ikpe Naịjirịa ma kwuo na ọ bụ maka nke ahụ mere na ya enweghị ikpe ma gwa ọkaikpe James Omotosho ka o nye ya ntọghapụ.
N'ụbọchị Fraịde, Nọvemba 20, 2025 ka ụlọikpe Ọkaikpe James Omotosho mara ya ikpe maka ebubo asaa ndị ahụ ma tụọ ya nga ibi ndụ ya niile n'ime ụlọmkpọrọ.
Ihe mere na m agaghị ama Nnamdi kanu Ikpe ọnwụ - Ọkaikpe Omotosho
Ọkaikpe James Omotosho kọwara ihe mere na ya agaghị ama Nnamdi Kanu ikpe ọnwụ mgbe ọ na-enye mkpebi ikpe ma na-enye ya ntaramaahụhụ.
Omotosho sị na "ụlọikpe ji obi umeala nakwa obi ebere dịka onye nweanyị bụ Jeso si kuzie na-eso ikpe Nnamdi Kanu".
O kwuru na ya kwesiri inye Nnamdi Kanu ntaramahụhụ ọnwụ maka ihe niile o mere mana "akwụkwọ nsọ ndị otu Krịsti na Mathew 23:23 kwuru maka ime ebere".
Ọ sị na ọ bụ maka ime ebere Jeso Krịstị kuziri maka ya mere na ya agaghị ama ya ikpe ọnwụ na ọzọ bụ na ụwa niile na-eti mkpu megide ịma mmadụ ikpe ọnwụ.
Ọ sị ọ bụ maka nke a mere ya ji "atụ Nnamdi Kanu nga ebighebi maka ịkpe ima ya n'ebubo nke mbụ, nke abụọ, nke anọ, nke ise na nke isii gọọmenti boro ya".
Omotosho kwukwara na "ndụ mmadụ dị Chukwu mkpa".