Agha mba Sudan: Anyị na-eri nri naanị otu mgbe kwa ụbọchị

Madina Yahya otu nne si Sudan kwuru na "I nwere ike ịrị nri n'abalị mana ị ma nri echi"
Madina na-ekwu ka ọnọdụ dị na El Fasher, obodo a ma ama na mpaghara ugwu Dafur nke Sudan.
Obodo ahụ bụbu ebe nwere ezi udo mana ọ dịghịzi etu a. Nke a mere ka Madina n'ezinaụlo ya kwapụ n'obodo ha maka na ha enweghị ike ịhụ nri oriri.
Mana ka ọ dị ugbua, ndị otu Rapid Support Forces amachiela obodo nke mere na ụfọdụ enweghị ihe ha ga-eri.
Dịka agha dị n'etiti RSF na ndị Sudan Armed Forces (SAF) na-aga n'ihu, obodo El Fasher bụ obodo gọọmenti Sudan ka nwere ikike na ya.
Obodo a nwere mmadụ ruru nde 1.5, nke gụnyere 800, 000 ọ bụ agha na-aga n'ihu chụpụrụ ha n'ime obodo ha. El Fasher bụ ebe dị mkpa bụrụkwa isi ụlọọrụ ndị agha na ebe azụmaahịa dị na Chad na Libya gbara agbata obi.
Dịka ndị ọrụ ahụike Sudan si kwuo, ihe ruru mmadụ 250 nwụrụ, ebe ụfọdụ merụrụ ahụ kemgbe agha malitere na El Fasher.
Na Sọnde, ndị ọrụ enyemaka ahụike MSF kwuru na opekata mpe ụmụaka abụọ nwụrụ ebe ndị ọzọ merụrụ ahụ mgbe ogbunigwe dara n'akụkụ ụlọọgwụ ụmụaka. Amabeghị ndị tụrụ ogbunigwe ahụ.
Ka RSF na-aga n;ihu n’ogu a, ndị ọkachamara UN ekwupụtala egwu ha maka "ihe egwu" maka ndị tọrọ n'ime obodo na-enweghị ike ịpụ.
Agha a agbala otu afọ
Kemgbe Eprel 2023, Sudan na-enwe ọgbaghara jọgburu onwe dị n'etiti ha na RSF, nke General Mohamed Hamdan “Hemedti” Dagalo na-edu, yana ndịagha nke General Abdel Fattah al-Burhan na-achị.
Ndị ọchịagha ahụ bụ ndị jikọrọ aka na agha n’afọ 2019 nke chụpụrụ onyeisiala Omar al-Bashir n’ọkwa.
Mana esemokwu maka mgbanwe ndị ọrụ nchekwa na-mgbanwe nke gọọmentị tinyere, metutara njikọ ha.
Ọgbaghara nke malitere na isi obodo Sudan Khartoum, gbasara ngwa ngwa na Darfur, mpaghara ugwu Kordofan na Gezira steeti.
Dị ka UN si kwuo, egbuola mmadụ 15,000 kemgbe mmalite esemokwu ahụ. Onye ọrụ mba Amerịka nọ na Sudan bụ Tom Perriello, kwuru na ọnụ ọgụgụ ndị nwụrụ nwere ike iru 150,000.
Ịnweta nri, ebe obibi, mmiri ọñụụ dị mma na ọrụ ahụike ka dị ụkọ n'ihe akpọrọ otu n'ime ọgbaaghara kacha njọ n'ụwa.
“Ọtụtụ mmadụ funarịrị m”

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
“Anyị na-enwe ụkọ nri,” ka Shamu Abker, onye si na mpaghara Tawila nke dị n'ọdịda anyanwụ El Fasher na-ekwu.
O kwuru, sị: “Ihe oriri a na-eri na-abụkarị otu nri kwa ụbọchị, nke bụ nri ụtụtụ.
Mgbọ ogbunigwe mere ka ya na ụmụ ya ndị nwoke gbapụ n'obodo ya. Ka ha na-agba oso n'okporoụzọ iji zere ebe ndịagha na-eme nyocha, otu nwa nwoke Shamu nwụrụ n'ihe mberede ụgbọala. Shamu n'onwe ya kwụsịrị ịhụ ụzọ n'ihi enweghị nlekọta ahụike.
Ọ sịrị, "Enwere m ọtụtụ mmadụ funarịrị m n'ihi agha ahụ, enweghị m ike idepụta ha niile."
“Ana m atụle uche nchekwa ụlọ m. Ugbu a, m na-anọdụ ala n'okpuru osisi, m na-echeta ụlọ m”
Madina Yahya, onye ya na ezinụlọ ya rutere El Fasher n’ọnwa isii gara aga, kwuputara ihe mwute nke ya.
O kwuru na “Ụmụ anyị bụ ndị ihe a metụtara. Ihe a agwụla anyị ike.”
N'ogige ndị agha a chụpụrụ, ọ chọpụtara mmekọrịta dị n'etiti ndị chọrọ enyemaka na ndị na-enye ya. Ọ na-ekwu na a na-ahụ onye ọbụla bịara ọhụrụ dịka ihe mgbakwunye ga-emetuta na akụrụngwa ae ji eleta ndị mmadụ.
“Ha na-ekwu na a na-atụ ha aka dị ka ndị agadi ma ọ bụ ndị ọhụrụ.” Nke a ka o kwuru banyere otú e si ewere ndị agha chụpụrụ n’ụlọ ha.
"Ha enweghị ike inyere onye ọ bụla n'ime anyị aka. Agha chụpụrụ anyị niile, ma ha na-amata ọdịiche dị n'etiti ndị ochie na ndị ọhụrụ."
Madina ekwupụtakwala nchegbu gbasara mkpa ụmụ ya nwanyị nwere.
“Anyị nwere ụmụagbọghọ, ha bụ ndị nọ n'afọ iri na ụma na-eto eto, ha chọkwara ihe anyị na-eweghị ike ime, n’ihi ya, ọ na-enye ndị mmadụ ohere irigbu ha.”
Na mgbakwunye tinyere ogbunigwe a tụrụ, esemokwu, ịkwakọrọ ihe na ebe a gbara ọkụ n'oge agha a, otu UN na òtù ndị ọzọ na-ahụ maka ihe ndị ruuru ndị mmadụ, edepụtawo mmegide ụmụnwanyị na ụmụagbọghọ.
Ndị ọrụ Human Rights Watch kwuru na akụkọ ha wepụtara n'ọnwa Ọgọst gara aga na "Ndịagha Rapid Support Forces na ndịagha ndị ọzọ, dekọrọ ọnụọgụgụ ndina n'ike na mpụ agha ndị ọzọ."
“Udo adịghị”

Ndị mmadụ nọ na mpaghara Darfur na-ekwu na ha na-ebi n'ụjọ mgbe niile tinyere na ha enwghị ike ị ga ebe ọbụla ha chọrọ.
Ụlọọrụ enyemaka mbaụwa Oxfam na-ekwu na ndị ahụ agha chụpụrụ n'ebe obibi ha nọ n'ihe ize ndụ nke.
Toby Harward, onye ọkachamara n'ihe gbasara ikike mmadụ kwuru na “Ndị bi n’obodo ahụ si n’ofe obodo Darfur niile. A ga-enwe ndị meruru ahụ n’obodo Darfur niile, ndị Arab na ndị Afrịka, ma ọ bụrụ na ndịagha na-alụ agha maka ịchịkwa El Fasher."
Ka agha El Fasher na-aga n'ihu, enweghị olileanya maka nkwụsị ya.
Onye ọchịagha SAF, Al-Burhanon, Mee 7 kwuru "A gaghị enwe mkparịtaụka, udo, maọbụ nkwụsị agha ruo mgbe a kwụsịrị ọgbaaghara a."
N'agbanyeghị atụmatụ mba Saudi Arabia, otu East Afrịka Intergovernmental Authority on Development (IGAD), otu Afrịkan Union na mba Amerịka, mbọ iji kparịta nkwekọrịta udo adibeghị.
Dịka ụlọọrụ UN na-ahụ maka ndị ihe na-atụ n’ọnụ bụ (OCHA) si kwuo, ihe karịrị otu ụzọ n'ụzọ atọ ndị mba Sudan nọ n’agụ ebe nde mmadụ 8.7 a gbapụla n'ụlọ ha.









