'Akpịrị m na-afụ m ụfụ, enweghị m ike ihi ụra' - n'ihu agha ọrịa mpox

Nwoke onye ọrịa mpox juru n'ihu ya

Ebe foto si, Mercy Juma/BBC

Nkọwa foto, Egide Irambona, chere na enyi ya nwoke bunyere ya ọrịa mpox dịka ọ bụ ya nyere nwunye ya ọrịa a
    • Onye dere ya, Mercy Juma
    • Ndị mere akụkọ a, BBC News, Bujumbura
  • Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4

Egide Irambona gbara afọ 40, nọ ala n’elu akwa ya n’ụlọọgwụ ebe ya na ụmụnwoke abụọ na-anata nleta.

Anyanwụ nke mgbede na-acha ya n’ihu. Ihu ya chapụrụ achapụ mana ọnya juru ya ihu, obi ya na aka ya.

“Enwere m ọnwa lymph fụrụ akpụ n’akpịrị m. Ọ na-ewute m nke ukwuu enweghị m ike ihi ụra. Mgbe ahụ mgbu ahụ kwụsịrị ebe ahụ, ọ kwagara n'ụkwụ m," ọ gwara BBC.

Mazị Irambona nwere mpox.

Ọ bụ otu n'ime ihe karịrị mmadụ 170 butere mpọx kemgbe ọnwa gara aga na Burundi, otu n'ime mba ndị kasị daa ogbenye n'ụwa. Ha mba DRC gbara ókèala, isi mmalite nke nfesa ọrịa mpox na nso nso a, nke butere opekatampe ọnwụ mmadụ 450 na mmadụ 14,000 a na-enyo enyo bu ya.

Na Burundi, enwebeghị onye e kwuru nwụrụ maka ọrịa mpox maọbụ etu ntiwapụ nke ọhụrụ akpọrọ Clade 1b ga-esi metụta ndị mmadụ. Enweghị ikike zuru oke iji mee nnyocha na mpaghara ndị ahụ o metụtara.

Agbanyeghị, ekwuputala ya dị ka ọrịa gbatagbata ahụike maka na ọ nwere ike gbasaa ngwa ngwa gaa na mba ndị ọ na-emetụtabughị.

Mazị Irambona anọọla n’ụlọọgwụ King Khaled University Hospital abalị 9. Etu ọrịa mpox si efesa bụ ọ bụrụ na gị na onye bu ya nwe mmekọ. Ọ dịka ọ bụ nwunye ya bunyere ya ọrịa mpox.

Nwunye ya nọkwa n’ụlọọgwụ enweta nleta.

“E nwere enyi m nwere ọnya. Ọ dịka ọ bụ ya bunyere m ya. Amaghịm na ọ bụ mpox. Ihe obi uto m bụ na enweghị ụmụ m butere ya”, Irambona kwuru.

Ụlọọgwụ a dị na Bujumbura bụ otu ebe a na-enye ndị nwere ọrịa mpox nleta.

Ndị bu ọrịa mpox nọ n’akwa 55 n’ime 61 dị n’ụlọọgwụ ahụ ọtụtụ n’ime ha bụ ụmụaka dị afọ 15. Ụlọọrụ ahụike mabụwa bụ World Health Organization kwuru na ọ bụ ụmụaka ka ọrịa aụ̄u ka emetụta.

Odette Nsavyimana yi uwe ahụike PPE

Ebe foto si, Mercy Juma/BBC

Nkọwa foto, Egwu na-atụ Odette Nsavyimana maka etu ọrịa mpox si agbasa n'ike n'ike

Odette Nsavyimara bụ dọkịta ahụike bụ onyeisi n’ụlọọgwụ ahụ, kwuru na ọnụọgụgụ ndị bu ọrịa ahụ na-agbago.

“Anyị na-ehibe ụlọ tent n’ezi.” Enweela atọ ugbua – otu bụ nke triage, otu bụ maka ndị a na-enyo enyo na ha nwere ọrịa mpox ebe otu nke ọzọ bụ maka ndị nwere ọrịa ahụ tupu e buga ha n’ime ụlọọgwụ.

“Ọ na-enye anyị nsogbu ọkachasi mgbe e butere ụmụaka. Ha enweghị ikeịnọ sọ ha, ya mere anyị ji si nne ha nọrọ. Ọ bụrụ na ha enweghị ihe ngosi ọbụla, o bụ ihe siri ike,” Dọkịta Nsavyimara dịka okpu akwa mkpuchi ihu mask ya.

Mba Burundi na-enwe ọtụtụ ndị bu ọrịa mpox.

“Egwu na-atụ m, ọ bụrụ na ha na-agbago, anyị enweghị ike ibu agha megide ya,”

A na-agba mbọ ịmachi ndị bu ọrịa ahụ ka ha ghara ikesa ya nye ndị ọzọ. E nwere ihe ngosi ebe niile, anyị anaghị ekwe ndị ọbịa ka ha na ndị bu ọrịa nwee mmekọ.

A rụrụ ụlọ tents n'ụlọọgwụ iji nabata ọtụtụ ndị bu ọrịa

Ebe foto si, Mercy Juma/BBC

Nkọwa foto, A rụrụ ụlọ tents n'ụlọọgwụ iji nabata ọtụtụ ndị bu ọrịa

Ndị ọrụ ahụike kwuru na ha enweghị akụrụngwa na ego. Naanị otu ebe nnyocha lab dị na Burundi ebe a na enyocha ọbara iji chọpụta ndị bu ọrịa mpox.

Inwe ebe obibi dị ọcha bụ nsogbu na Bujumbura maka na enweghị mmiri dị ọcha e ji eme ihe.

Onyeisi ụlọọrụ Centre for Public Health Emergency Operations bụ Dọkịta Liliane Nkengurutse kwuru na-egwu na-atu ya maka ihe nwereike ime n’ọdịnihu.

“Nke ka njọọ bụ na ọ bụ naanị otu ebe ka a na-eme nnyocha ichọpụta ndị bu ọrịa mpox.

Ndị ọrụ ahụike na-akpọ ụlọọrụ nnyocha lab na ha nwere onye bu ọrịa mpox maka ọ na-enwe oge tupu eziga ndị ga-aga nwete ọbara ha a ga-eji mee nyocha na lab.

Ọ na-enwe ọtụtụ oge iji wepụta nsonaazụ nnyocha ọbara e mere. Anyị chọrọ ihe dịka nde dọla 1ri na anọ ($14m) iji kwalite nnyocha anyị na-eme n’ogogo dị elu.

Dịka a na-ekwu okwu maka ọgwụ mgbochi ga-eru DR Kongo n’izuụka na-abịa, enweghị akụkọ kwuru na ọ ga-eruta Burundi.

Ndị kwụrụ n'ahịrị n'ọdụ ụgbọala

Ebe foto si, Mercy Juma/BBC

Nkọwa foto, Ọtụtụ mmadụ amaghị maka ọrị mpox na Burundi
Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Mmata ọhaneze gbasara mpox dị pere mpe.

Bujumbura dị naanị nkeji iri abụọ site n'ókè ya na DR Kongo ma bụrụ ebe a na-eme njem na azụmahịa n'oke ala. Mana enweghị echiche maka ihe nwereike ime ma ọ bụrụ na e nwe onye butere ọrịa mpox.

Ihe omume na-aga n'obodo ahụ. Ndị mmadụ ka na-azụ ma na-ere ngwaahịa dịka ha na-emebu. Ha na-ekwe n’aka, amakụ na ezigbo mmekọrịta bụ ihe e ji mara ha.

Enwere ogologo ahịrị n'ọdụ ụgbọala, ebe ndị mmadụ na-agbakiliri ana ibanye n'ụgbọala.

“Ọtụtụ ndị aghọtaghị ihe nke a nwereike ibute. Ọbụlagodi ebe enwere onye bu ya, ndị mmadụ ka na-emekọ ọnụ, ”Dọkịta Nkengurutse kwuru.

Ọtụtụ mmadụ BBC gwara okwu na Bujumbura gosiri na ọtụtụ amaghị ihe mpox bụ. Ndị mara ihe ọ bụ amaghịkwa na ọ na-agbasa n’obodo n’ike n’ike.

“Anụla m banyere ọrịa a, ma ahụtụbeghị m onye na-arịa ya. Ahụla m ya na soshal midia, "otu onye kwuru.

“Amaara m na ọ na-emetụta ụmụaka ọhụrụ na ndị na-eto eto. Egwu ya na-atụ m, mana nke ahụ apụtaghị na m ga-anọ n'ụlọ. M ga-arụ ọrụ. Ezinụlọ m ga-eri nri,” onye ọzọ kwuru.

Ndị ọrụ ahụike maara na ime ka ndị mmadụ kpachara anya nwereike isi ike n'etiti ọnụ ọgụgụ ndị na-ata ahụhụ maka ajọ ọnọdụ akụnaụba obodo.

Mana ha ga-aga n'ihu na-agwọ ndị ọrịa, gbaa mbọ hụ na ha nweree onwe ha ma gbalịa chọpụta ndị ha na ha nwere mmekọrịta iji gbochie mgbasa nke ọrịa mpox.