Xi Jinping ewerela oche ọchịchị mba China nke ugboro atọ

Xi Jinping, onyeisiala mba China

Xi Jinping nke mba China etiwaala akụwaala ihu akwụkwọ dịka o weere oche ọchịchị mba ahụ nke ugboro atọ n’otu usoro.

Nke a mere o jiri bụrụ onye ndu kachasị akpa ike na mba ahụ kamgbe ọchịchị Mao Zedong.

Onye ndu pati ha bụ Shanghai Communist bụ Li Qiang so Xi gbagoro n’ọgbọ dịka ha kpọpụtara ndị ndu mba China ọhụrụ.

Ndị ndu ndị ọzọ a gụnyere; Zhao Leji, Wang Huning, Cai Qi, Ding Xuexiang na Li Xi.

Akụkọ sị na ndị ndu niile a bụ ndị na-erubere Xi Jinping dị afọ iri isii na itoolu isi ma bụrụkwa onye ndu ndịagha mba China a kpọrọ ‘Central Military Commision.

Ihe gbapụtara ihe na nhọpụta ndị ọchịchị ndị a bụ na otu mkpụrụ nwaanyị nakwa ndị ntoroọbịa esoghi na ha.

Nhọpụtagharị Xi nke ugboro atọ na-abịa dịka pati mechara ọgbakọ n’ụbọchị Satọde nke e jiri hiwe ngalaba ‘Politburo Standing Committee’, gụnyere ya na mmadụ isii ndị ọzọ.

Xi kelere ndị pati ya maka “ịtụkwasị ya na ndị obi ọchịchị ya obi”.

Ọ gara n’ihu kwuo "anyị ga-agba mbọ ime ka China bụrụ mba kwụụ chịm n’ụwa, nke a ga-eji na-ama atụ."

Ndị obi ọchịchị mba China

Ihe i kwesịrị ịma maka Xi Jinping

Xi Jinping

Ebe foto si, Reuters

  • A mụrụ Xi Jinping n’afọ 1953 dịka nwa nke abụọ nne na nna ya bụ Xi Zhongxun na Qi Xin.
  • Nna ya bụ Xi Zhongxun so na ndị hiwere otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị mba China a kpọrọ Chinese Communist Party (CCP) n’ọnwa Julaị afọ 1921.
  • E mechara chụpụ nna ya na pati ahụ mgbe ya na Onyeisiala ha n’oge ahụ bụ Mao Zedong nwere nsogbu.
  • Nke a mere e jiri chụba Xi n’ime ime obodo ma tụọ nna ya mkpọrọ ihe karịrị afọ iri.
  • Mgbe Xi tolitere, a jụrụ ịnabata ya na pati ahụ maka ihe nna ya mere, mana e mechara nabata ya.
  • Ọ laghachịrị n’isi obodo Beijing bụ ebe ọ nọ gbagide mbọ n’ihe ndọrọ ndọrọ ma jikwa ọkwa dị iche iche.
  • N’afọ 2012 a họpụtara ya dịka onye ndu mba ahụ, ọ ṅụọ iyi ime ka China bụrụ mba siri ike n’ụwa.
  • Kamgbe ahụ, mba China abụrụla mba a sị na akpagbu ikike dịịrị onye nke a sị na ha anwụchiela mmadụ karịrị otu nde banyere nke a.
  • Xi lụrụ nwunye ya bụ Peng Liyuan n’afọ 1987, ha mụtara otu nwa nwaanyị bụ Xi Mingze