Lee steeti ndị a chụpụrụ pati nọ n'ọchịchị na ntuliaka ọkwa Gọvanọ

E mere ntuliaka nke e ji họpụta ndị ga-achi dịka gọvanọ na steeti iri atọ na otu ndị nọ na Naịjirịa. E mere ya bụ ntuliaka n'ụbọchị iri na asatọ nke ọnwa Maachị afọ 2023.
All Progressive Congress (APC) nwere oche gọvanọ iri abụọ na otu mama na steeti iri na itoolu n'ime ha ka e mere ntuliaka.
N'aka nke ọzọ, Peoples Democratic Party (PDP) nwere steeti iri na anọ ebe e mere ntuliaka na steeti iri na abụọ.
Otu All Progressive Grand Alliance nwere otu ọkwa gọvanọ na Naịjirịa, mana e meghi ntuliaka na ya.
Dịka e mechara ntuliaka, APC napụrụ ndị PDP steeti Benue na Sokoto, ebe PDP napụrụ ha Plateau na Zamfara.
Labour Party napụrụ PDP Abia Steeti ebe New Nigeria Peoples Party (NNPP) napụrụ ndị APC Kano steeti.
Lee etu pati dị iche iche si na-apụ ibe ha ọchịchị n'ọkwa Gọvanọ;
Abia Steeti
Alex Otti nke Labour Party meriri Okey Ahiwe nke PDP na ntuliaka ọkwa gọvanọ Abia Steeti.
PDP achịala afọ iri abụọ na anọ tupu Labour Party merie ha na ntuliaka afọ 2023.
Kama Ahiwe na-ekwu na ọnabataghị mpụtara ya bụ ntuliaka, ebe Okezie Ikpeazu onye bụ gọvanọ Abia Steeti kwuru na ya nabatara mpụtara ntuliaka ahụ.
Ikpeazụ gwara Ahiwe ka ọ hara ịga n'ụlọikpe mana Ahiwe kwuru na ọ ga-aga ụlọikpe.
Inec nyere Alex Otti asambodo mmeri ntuliaka n'ụbọchị iri atọ nke ọnwa Maachị afọ 2023.
Otti ji ọnụọgụgụ vootu 86,938 merie Ahiwe nke otu PDP.

Benue Steeti
Na Benue Steeti, otu pati APC nke Ụkọchukwu Hyacinth Alia ji ọkọlọtọ ha zọọ okwa gọvanọ steeti ahụ meriri Titus Uba nke otu PDP na ya bụ ntuliaka.
E nwere ọgbaghara dapụtara oge ntuliaka a n'ebe dịka mpaghara Gboko na steeti ahụ.
Inec kwuru na Hyacinth Alia ji vootu ọnụ ọgụgụ 473, 933 merie Uba onye nwetara 223,913 na ya bụ ntuliaka.
N'aka nke ọzọ kwa bụ na Gọvanọ steeti ahụ enweteghị vootu ọ ga-eji merie ntuliaka nke onye omeiwu steeti ahụ ma o nweghị kwa ike ime ka onye pati ya bụ Uba merie ntulaika.

Kano Steeti
Na Kano steeti, Abba Yusuf ji ọkọlọtọ otu New Nigeria People’s Party (NNPP) meriri Nasiru Gawuna nke otu APC bụ ndị nọ n'ọchịchị.
Dịka o siri dị, Gawuna kwuru na ya anabataghị mpụtara ntuliaka a ma sị na Inec ekwesịghị ịkpọpụta mpụtara ya bụ ntuliaka.
Kama onye nnọchiteanya Inec na Steeti ahụ bụ Ahmad Doko kwuru na otu NNP meriri ya bụ ntuliaka n'ezie.

Sokoto Steeti
Ngalaba Inec kpọpụtara Ahmed Aliyu nke APC dịka onye meriri ntuliaka gọvanọ Sokoto Steeti dịka o meriri Saidu Umar nke otu PDP.
Aliyu bụbu osote gọvanọ mgbe Aminu Tambuwal bụ gọvanọ steeti ahụ site n'afọ 2015 ruo 2019. N'afọ 2019 ya na Tambuwal zọrọ ya bụ ọkwa kama Tambuwal ji 342 merie Aliyu.

Plateau Steeti
Otu PDP sitere n'aka Caleb Mutfwang merie ntuliaka nke ọkwa gọvanọ Plateau steeti.
PDP napụrụ otu pati APC ọchịchị na steeti ahụ dịka Nentawe Yilwatda ji ọkolọtọ pati ahụ zọọ ya bụ ọkwa.
Onye nnọchite anya Inec bụ Idris Amali kpọpụtara Mutfwang nke PDP dịka onye meriri ya bụ ntuliaka.
Gọvanọ steeti ahụ bụ Simon Lalong nke otu APC banyere n'ọchịchị na steeti ahụ n'afọ 2015.

Zamfara Steeti
Ngalaba Inec akpopụtala Dauda Lawal nke otu PDP dịka onye meriri ntuliaka nke ọkwa Gọvanọ Zamfara steeti dịka o meriri onye nọ dịka gọvanọ steeti ahụ bụ Bello Matawalle ji ọkọlọtọ APC zọọ ya bụ ọkwa.
Onye nnọchite anya Inec bụ Kashim Shehu kpọpụtara Lawal dịka onyemeriri ya bụ ntuliaka.
N'ime okpuruọchịchị iri na anọ nọ na Zamfara, PDP meriri iri ebe APC meriri naanị anọ.

Etu a ka o si kwuru, kama Inec kagburu ntuliaka ndị e mere n'Adamawa nakwa Kebbi Steeti.
Enyela ụfọdụ ndị gọvanọ a asambodo mmeri ntuliaka dịka iwu Inec siri dị.









