Albinism in Nigeria: "Ndị mmadụ na-ajụ ma m nwereike ịlụ di maka na m bụ onye anyarị"

Albinism in Nigeria: "Ndị mmadụ na-ajụ ma m nwereike ịlụ di maka na m bụ onye anyarị"

Esther Igbojionu bụ onye anyarị akọwaala etu ya bụ ihe si metụta ya.

O kwuru na kemgbe ọ dị obere ma rue ugbua, ndị mmadụ na-agụrụ ya egwu akaja bụ "Oyibo Pepper".

Mana o kwuru na ihe ndị ahụ anaghị echekasị ya "Ndị anyarị bụ ndị mara mma" ka o kwuru.

Onye ọzọ so kwu okwu gbasara ihe ọ na-agabiga bụ Chimezie Udechukwu.

O kwuru na kemgbe ọ dị na nwata, ọ marala na ọ dị iche.

"Kemgbe m malitere ịzọ ikike ruuru ndị anyarị, akụkọ ụgha ndị m na-anụ na-agbawa obi" ka Udechukwu kwuru.

Gee ihe ha abụọ kwuru n'uju ebe a.