Banky W, Williams Uchemba, Moses Bliss na ndi ozo a ma ama chotara onye nke ha na soshal midia

Lee ụfodụ ndị ama ama hụtara onye ha lụrụ n'ihu Soshal Midia

Ebe foto si, Moses Bliss, Uchemba Williams, Banky W/ Instagram

Nkọwa foto, Lee ụfodụ ndị ama ama hụtara onyi ha lụrụ n'ihu Soshal Midia
    • Onye dere ya, Ezennia Uche
    • Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist

Otu onye amamihe kwuru okwu si na ihunanya nwere ike izute mmadụ ebe ọbụla. Nke a di ire n'uzo di icheiche atumadi n'oge teknuzu na soshal midia a otutu ndi mmadu anaghi apuzi apu.

Ọtụtụ ndị a ma ama nakwa ndị amaghị ama anorola n'elu ekwenti ha maobu na komputa ha chota odi ha n'obi na ndi ha lụrụ site na soshal midia.

Ngwa lee ndị a ma ama na Naịjirịa hụtara onye ha lụru na Soshal Midia

Moses Bliss na Marie Wiseborn

Moses Bliss bụ otiegwu ụka ama ama gbanyere enyi ya nwaanyị bụ Marie Wiseborn ọla na'ụbochị 20 Janụwarị 2024 iji kwe ya nkwa ọlụlụ.

Ebe foto si, Moses Bliss/Instagram

Moses Bliss bụ otiegwu ụka a ma ama gbanyere enyi ya nwaanyị bụ Marie Wiseborn ọla na'ụbochị 20 Janụwarị 2024 iji kwe ya nkwa ọlụlụ.

Ọtụtụ mmadụ juru ajuju etu Moses siri mata nwatanwayị ahụ. Moses gwara ha na ya na Marie matara n‘Instagram.

Dịka o siri kọo, Marịe tinyere ihe onyoyo ebe ọ na-agba egwu Moses Bliss kụrụ na 'Instagram', denyere aha Moses na ya bụ ihe onyonyo nke mere Moses jiri hụ ya ma kpọtụrụ ya.

Moses tinyere egwu ahu Marie gbara chabara ya anya o jiri choba ya. O kwuru "ubochi taa kpomkwem afo 2023, ka mmadu kpoturu n'egwu a Marie gbara..."

Etu ahụ ka adim na mma ha siri bido wee ruo ụbọchị ha kwerịkọtara ịlụ onwe ha.

Skip Instagram post
Hapụ Instagram ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of Instagram post

Banky W na Adesuwa Etomi

Banky W na Adesuwa Etomi

Ebe foto si, Banky W/Instagram

Nkọwa foto, Banky W na Adesuwa Etomi

Olubankole Wellington e ji Banky W mara, bụ otiegwu a ma ama na-alụ Adesuwa Etomi bukwa onye ihe ejije Nollywood.

Alụm di na nwuye ha turu ụwa n’anya, nke meere ụwa jiri malite inyocha etu mmekọrịta ha siri bido. Adesuwa gwara ha na Banky hụrụ ya n’afọ 2015 bido juba ese ya.

Banky kwuru na ya buru uzo tie nwunye ya anya ebe ya na-ese onyonyo ya.

O kwuru na ya tiri anya mana ihe kuru ya ntu n'isi kpomkwem bu oge ya gara n'akara ya n'Instagram ebe ya lelere foto niile ya di ebe ahu.

Banky kwuru na oge ya huru otu onyonyo ebe Adesua na-agu egwu uka n'Instagram bu ihe nyere ya ikike izigara ya ozi n'Instagram. O kwuru na Adesua zaghachiri ya.

Etu ahụ ka adim na mma ha abụọ siri bido ruo mgbe ha lụrụ di na nwuye n'afo 2017.

Ha amuola otu nwa nwoke.

Ebuka Obi Uchendu na Cynthia Obianodo

Ebuka Obi Uchendu na Cynthia Obianodo

Ebe foto si, Ebuka/Instagram

Nkọwa foto, Ebuka Obi Uchendu na Cynthia Obianodo

Onye ihe ejije soshal midia nakwa onye na-ahazi ‘Big Brother Naija’ a ma ama bụ Ebuka Obi Uchendu sokwa na ndị hụtara asampete ha na soshal midia.

Nwuye Ebuka bụ Cynthia Obianodo gwara ụwa na ya na Ebuka di ya matara onwe ha n’ọbaọzị ‘Twitter’ bụzị ‘X’. Dịka o siri kwu, ha matara n’ọnwa Nọvemba afo 2014, lụọ dị na nwụnye 'afo 2015.

Ha amuola ụmuaka abụọ.

Willaim Uchemba na Brunella Oscar

Willaim Uchemba na Brunella Oscar

Ebe foto si, Uchemba Williams/Instagram

Nkọwa foto, Willaim Uchemba na Brunella Oscar

Onye ihe ejije ‘Nollywood’ bụ Williams Uchemba na nwunye ya bụ Dọkịnta Oscar Brunella, hụtara onwe ha n’ihu akwụkwọ (Facebook).

Brunella gwara ụwa etu o siri mata di ya , o kwuru na ya lelere ihe onyoyo Uchemba mere n’ihu akwụkwọ Facebook n'ọnwa Nọvemba 2016, ebe ọ na-agwa ndị ntọrọbia okwu Chukwu.

O kwuru na okwu Chukwu Uchemba kpaliri mmuo ya, mere o ji degaara ya ozi n’akara Facebook ya. Etu ahụ ka ọ dị mma ha abụọ siri bido wee ruo mgbe ha lurụ di na nwunye n’afo 2020.

Ha amuola otu nwa nwaanyị.

Simi na Adekunle Gold

Simi na Adekunle Gold

Ebe foto si, Adekunlegold/Instagram

Otiegwu abụọ a ma ama bụ Simisola Ogunleye na Adekunle Gold bụ di na nwunye, ha kwuru na ha hụtara onwe ha n’ihu akwụkwọ.

Etu ahụ ka adim na mma ha abụọ siri bido, nke mechara buru alum di na nwaanyị.

Mmadụ abụọ a lụrụ onwe ha n’afọ 2019, ha amụọla otu nwa nwaanyị.