Etu e si gbuo ụkọchukwu Alakuba n'Ebonyi steeti

Ibrahim Iyiorji

Ebe foto si, Muhammad Kabir Orjiegbulam

Akụkọ pụtara na-ekwu na ndị omekome bu egbe agagbuola Sheikh Ibrahim Iyiorji bụ ụkọchukwu Alakuba n'Ebonyi steeti.

Ha kọwara na ọ bụ n'abalị ụbọchị Sunde ka awakporo ụlọ ya dị n'Isu n'okpuruọchịchị Onicha dị na steeti ahụ.

Onye kwuputara ozi ọnwụ ya bụ Muhammad Kabir Orjiegbulam n'otu a kpọrọ Islam in Igbo Land dị na Facebook kọwara etu o si me.

"Nwanne anyị anwụọla ugbua n'ụlọọgwụ Federal Teaching dị n'Abakaliki" ka o depụtara n'otu ahụ.

O kwukwara na agbara ya egbe n'ubu nakwa n'afọ dị nso n'obi ya n'abalị ụbọchị Sunde.

"E liela ya (Iyiorji) dịka iwu kwadoro okpukpere anyị si nye" ka o kwukwara.

Mgbo niile a gbara ịnweta ndị uweojii Ebonyi steeti amịtaghị mkpụru dịka ọnụ na-ekwuru ha bụ Chris Anyanwụ azaghị ekwentị ya.

Onye bụ Ibrahim Iyiorji?

Ibrahim Iyiorji

Ebe foto si, Kabir Orjiegbulam

Ibrahim Iyiorji bụ onye Ohaozara Isu dị n'okpuruọchịchị Onicha dị n'Ebonyi steeti.

Ọ gụchara akwụkwọ ma kuziwe nkuzi na Islamic Centre dị n'Afikpo kemgbe 1982.

A mụrụ ya 25 Juun afọ 1965. Ọ lụrụ nwaanyị ma mụta ụmụ ise, nwaanyị anọ nakwa otu nwoke.

Nwunye kọwara na ha nọ be ha na mgbede ụbọchị ụka mgbe dimkpa isii bu egbe nọ n'ọgbaatumtum atọ dabatara na be ha.

Ha hụrụ nwaanyị ahụ ebe ọ nọ n'iro ma kpọrọ ya baa n'ime na-ajụ ha maka ego, sị ha weta ego ha debere.

Ọ bụ ka nke a na-eme ka debere nwoke ahụ n'ala ma gbanye ya egbe n'afọ nakwa n'ubu ya.

O bibu n'Enọhịa n'Afikpo ebe ọ na-akụzi nkuzi mana o nwetara ụlọ nkuzi ọzọ n'Ohaozara nke mere ka ya na ezinaụlọ ya laghachite n'obodo ya.

Ezinaụlọ nwoke ahụ nwụrụ bụ Iyiorji nakwa otu ndi okpukpere Alakuba dị n'Ebonyi steeti ekpesala okwu ọnwụ na mwakpo a n'aka ndị uweojii.

O teela aka a na-amaja anyị - ndị okpukpere Alakuba n'ọwụwa anyanwụ

Kabir Orjiegbulam

Ebe foto si, Kabir Orjiegbulam

Kabir Orjiegbulam gwakwara BBC Igbo n'ekwentị na ihe na-eme ndị okpukperechi ha adịghị ya mma n'obi.

Ọ kọwara na o teela aka ndị mmadụ na-ezigara ha ozi mmaja na peeji ha ebe ha nwere ọgbakọ na Facebook.

Ọ sị na ọ bụ ndị "unknown gunmen" gara be Iyiorji gbaa ya egbe ugboro anọ maọbụ ise.

"E buru ya gaa ụlọọgwụ dị n'Abakaliki, n'abalị ụbọchị Monde, ọ nwụọ, anyị e lie ya".

"Ọ bụ ndị unknown gunmen, ha na-ezigara anyị ozi mmaja nakwa ozi ịkpọasị oge niile" ka o kwuru.

O kwukwara na a na-akpaso ndị okpukperechi Alakuba ndị Igbo ajọ agwa.

Orjiegbulam sị "O nwee etu e si kwute maka Peter Obi, e lewe anyị anya, e kwuo maka anyị, e kwuo maka Nnamdi Kanu elewe anyị anya, ọ dịghị mma!"