Mohammed Al Fayed nwebu Harrods anwụọla n'afọ 94

Mohammed Al Fayed

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Mohammed Al Fayed

Mohammed Al Fayed bụbu onyeisi Harrods anwụọla dịka ọ dị afọ iri itoolu na anọ.

Al Fayed bụ nna Dodi Al Fayed so Diana, Adaeze Wales nwụ n’ihe mberede okporoụzo n’afọ 1997.

N’ozi nke ezinaụlọ ya wepụtara n’ụbọchị Fraịde kwuru sị “Nwunye Mohammed Al Fayed, ụmụ ya nakwa ụmụ ụmụ ya chọrọ ịkwuputa ọnwụ di ya, nna ha nakwa nna nna ha bụ Mohammed bụ onye kara nka nwere nwụọ n’ụbọchị 30 nke ọnwa Ọgọst afọ 2023”.

“O biri ogologo ndụ juputara n’ọṅụ n’etiti ndị ọ hụrụ n’anya”.

A mụrụ Al Fayed na mba Ijipt bụ ebe ọ wulitere ahịa dị ukwu tupu ọ gaa mba Briten n’afọ 1970s.

Onye bụ Mohammed Al Fayed?

Otu bọọlụ Fulham FC so n'ụlọọrụ dị icheiche o nwere na mba Briten

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Otu bọọlụ Fulham FC so n'ụlọọrụ dị icheiche o nwere na mba Briten
  • A mụrụ ya na mba Ijipt n’ọnwa Jenụwarị afo 1929.
  • Ọ na-erebu mmanya n’ụzọ ebe o si wulite ụlọorụ ukwu ya.
  • Ọ lụrụ Samira Khashoggi n'afọ 1954 onye nyere ya aka wulite azụmahịa ya.
  • N’afọ 1966, e mere ya onye ndụmọdụ Sultan na-achị Brunei bụ otu ndị kachasị nwe ego n’ụwa mgbe ahụ.
  • Ya na nwanne ya nwoke bụ Ali Al Fayed zụtara ụlọ oriri Ritz dị na Paris n’afọ 1979
  • Ha mechara zụta ụlọahịa ukwu bụ Harrods n’ọnwa 1985.
  • Ọ zụtara otu bọọlụ Fulham FC n'afọ 1997
  • O resiri mba Qatar ụlọahịa Harrods n'afọ 2010.

E liri ya n’akụkụ nwa ya nwoke Dodi so Adaeze Diana nwụ n’ihe mberede okporoụzọ.

Akụkọ kwuru na ruo na nka ya ọ kwụsịghị ịjụ ajụjụ maka ọnwụ nwa ya nwoke ahụ bụ nke wutere ya nke ukwu.