Etu nwaanyị Naịjirịa si zubata nwa ọhụrụ na Briten

Ebe foto si, Getty Images
- Onye dere ya, Sanchia Berg &Tara Mewawalla
- Ebeg o si, BBC News
- Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2
N'afọ gara aga ka a nwụchiri otu nwaanyị n'ọdọụgbọelu 'Gatwick Airport' dịka o si Naịjirịa kuru nwatakịrị a mụrụ ọhụrụ bata.
Nwaanyị ahụ onye ya na di ya na ụmụ ya bi na West Yorkshire dị na Briten gwara dọkịta ya na ọ dị ime tupuu ọ gawa Afrịka.
Mana nke a abụghị eziokwu.
Ka otu ọnwa gachara , o kuru nwatakịrị onye ọzọ nke mere ka a nwuchie ya dịka onye a na-enyo maka ịtụ mgbere nwa.
Okwu a bụ akụkọ mbụ BBC na-esochi anya na nsonso a dịka BBC na-eso ihe na-eme n'ụlọikpe nakwa ezinaụlọ ya na nsonso a.
Otu onye ọkachamara kwuru na ọ dị ka o nweela ndị si Naịjirịa na-ebute nsogbu 'baby factory' na mba Briten.
Ụmụ na-ezokarị ezo ezo'
Nwaanyị ahụ anyị ga-akpọ Susan bụ onye Naịjirịa mana ya na di ya na ụmụ ha bi na Ingland kemgbe ọnwa Juun 2023.
Onye ọrụ nleta nwetara ikike ibi na Briten, Susan kwuru na ya dị ime. Mana nnyọcha ọbara na 'scan' gosiri na nke a abụghị eziokwu.
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Kama Susan nwere akpụ nke ndi dọkịta na-enyo na o nwere ike ịbụ kansa mana ọ jụrụ ịnara nleta ahụike maka ya.
Susan na-agwa ndị mmadụ nakwa onye ọ na-arụrụ ọrụ na afọ ime ya adịghị apụta n'oge ruo ọnwa 30.
Susan mere njem gaa Naịjirịa n'ọnwa Juun afọ 2024, sị na ọ chọrọ ịnọ ebe ahụ mụọ nwa. O mechara kpọọ otu ụlọgwụ na Briten sị na ya amụọla nwa.
Uche gwara ndị dọkịta bụ ndị kpotụrụ ngalaba na-ahụ maka ụmụaka.
Ka ọ wuchiri Briten kuru nwa ọhụrụ nwaanyị anyị ga-akpọ Eleanor, ndị uweojii Sussex nwụchiri ya.
E mechara hapụ ya ka ọ lawa mana ndị isi uweojii okwu ahụ dị n'aka kwuru na ha anaghị enyocha okwu ahụ ka ọ dị ugbua.
Ka e mechara Susan, di ya na Eleanor nchocha DNA tupu a kpọga Eleanor n'ụlọ nlekọta ụmụaka.
Susan sịrị, "Ọ bụrụ na ha mecha nnyocha ọ bụrụ na o gosi na m bụ nne Eleanor, achọrọ m ka ha kpọghachi ya ozigbo."
Mana nnyocha gosiri na o nweghị ihe jịkọrọ nwa ọhụrụ na Susan na di ya, Susan gbanwere akụkọ ya.
Ọ sịrị na ya mere IVF n'afọ 2023 tupu ya abịa Briten nke ya ji akwa nakwa mmiri olulu( 'sperm'), na ọ bụ ya mere na DNA ji gbajọọ.
Susan wetara akwụkwọozi si n'ụlọgwụ Naịjirịa nke dọkịta nwe ụlọọgwụ ahụ binyere aka , sị na ọ mụrụ nwa ebe ahụ nakwa ụlọọgwụ ọzọ nke kwuru na o mere IVF ebe ahụ.
Susan wetakwara foto nakwa ihe onyonyo gosiri ebe a na-ana nwa n'ụlọọgwụ ahụ.
O nweghị onye a hụrụ ihu ya n'ihe onyonyo ahụ. Otu gosiri nwaanyị gba ọtọ onye nke ichi(placenta) na eriri otube( umbilical cord) dị n'agada ya.










