Ọ bụ ndị ọchịehi tọọrọ ụmụakwụkwọ ndị nwaanyị anọ n’Oji River - PG

Ebe foto si, Getty Images
Kemgbe a tọọrọ ụmụakwụkwọ n'School of Health dị n’Oji River Enugwu, ọtụtụ akụkọ na-efegharị na sọshal mịdịa.
Nke kachasị bụ akụkọ gbasara mmadụ ole ndị ntọ ahụ tọọrọ na ihe kpatara e ji tọrọ ha.
Ụfọdụ ndị gwara BBC Igbo okwu gụnyere ụmụakwụkwọ, ndị isi obodo na otu onyeisi n’ụlọakwụkwọ ahụ dị n’Enugwu na-arụaka ndị bụ ndị ntọ ahụ ma kwuputa ihe ha nụrụ kpatara ha ji bido ịtọ mmadụ.
Onyeisi na-achịkọta ndị PG bụ Ejike Ilo Tasie gwara BBC Igbo na kemgbe ndị ntọ ahụ tọọrọ mmadụ anọ, na ha tinyere anya na-ala ma chọpụta na o mere n’ezie.
Ha chọpụtakwara na ndị ntọ ahụ bụ ndị na-achị ehi na mpaghara ebe ahụ.
Ha na-aṅụ iyi na ha ga na-atọ ndị mmadụ ruo mgbe ha nwetara ego ehi ha funarịrị ha.
Otu onyeisi n’ụlọakwụkwọ ahụ kwukwara na ọ bụ ndị ọchịehi tọọrọ ụmụakwụkwọ ha, ebe ụmụakwụkwọ ndị ọzọ bụ ndị maara ndị a tọọrọ gwara BBC na ọ bụ ndị ọchịehi.
Ihe na-ese okwu n’etiti ndị ọchịehi na ndị Oji River
Dịka Ejike Ilo Tasie si kọwa “ihe anyị na-anụ na enwere ndị gbara mkpọnala bụ nke mere ehi ndị ọchịehi jiri gbafuo ma gbasasịa, ya mere ha ji bido ịtọ ndị be anyị”.
Ndị ọzọ kwuru okwu sịrị na ndị ọchịehi na-emebi ihe niile ha kọrọ n’ubi ma were ya na-azụ ehi ha.
Otu onyeisi n’ụlọakwụkwọ School of Health dị n’Oji River achọghị ka a kpọọ aha ya kwuru na ọ bụ mmadụ anọ ka ndị ọchịehi tọọrọ.
Ọ kọwara na mmadụ atọ bụ ụmụakwụkwọ ha ebe otu onye nke ọzọ bụ nwata akwụkwọ ochie ha.
O kwukwara na ndị niile a tọọrọ bụ ụmụnwanyị.
Ọ gịnị ka Gọọmentị na-eme ụgbua?

Ebe foto si, Getty Images
Mgbe BBC kpọrọ ndị na-anọchite anya gọọmentị Enugu steeti maka ọnọdụ ụmụakwụkwọ a tọọrọ, ha ekwughi ihe ọbụla maka ya.
Uche Anichukwu azaghị ekwentị ma ọ bụ zaghachị ọzị ekwentị e zigaara ya.
Onye nke ọzọ bụ Dan Nwome kwuru ka akpọọ ndị uweojii gbasara ihe mere
Ihe anyị ma maka ndị a tọọrọ na School of Health Technology Oji River n'Enugwu
Akụkọ kwuru na ndị ntọ wakporo School of Health Technology Oji River dị n'Enugwu steeti ma tọrọ ọtụtụ ndị mmadụ.
Ndị a tọọrọ gunyere nwata akwụkwọ na ndị ọzọ amabaghị ndị ha bụ.
Onye si n'obodo ahụ na-achọghị ka a kpọ aha ya gwara BBC Igbo na ihe a mere n'ime ụlọakwụkwọ na mgbede ahụ
Onye a gara n'ihụ kọwara BBC na mkpamkpa ahụ kpara n’abalị Wenezde, 14 Ọgọst, afọ 2024 n’ihe dịka elekere anọ nke mgbede.
Kedụ ka ya bụ mkpamkpa si wee mee?
Akụkọ anyị hụrụ n'onyoonyo na-efegharị na soshịal midịa gosiri na ọ bụ ọtụtụ mmadụ ka a tọọrọ mana anyị amabeghị ọnụ ọgụgụ ha niile.
Mana onye gwara anyị okwu sị na ya nụrụ na ọ bụ mmadụ atọ ka a tọọrọ mana otu onye bụ nwataakwụkwọ na School of Health Technology Oji River.
Ọ gwara anyị na ya amaghị mmadụ abụọ ndị ọzọ ya nụrụ na a tọọrọ.
Gụọ ka o si pụta n'ọnụ onye a:
“A tọọrọ ha na ime School of Health Technology Oji-River dị na Enugu”.
“Ndị ntọ ahụ ejirila ekwenti kpọọ ezinaulo otu onye m maara n’ime ndị ha tọọrọ nwere gwa ha ego ole ha ga enwete tupuu atọghapụ ya”
“Oge m gara na ezinaụlọ ha, obi adịghị ha mma, ọtụtụ nọ na ebe akwa”.
Kedụ ihe ndị uweojii kwuru maka okwu a?
Mana ndị uweoji n’Enugwu steeti ekwuola na ọ bụ eziokwu na a tọọrọ mmadụ atọ bụ ụmụakwụkwọ Enugu State College of Health Technology Oji River.
Ha mere ka amata nkea n’akwụkwọ ozi nke ọnụ na-ekwuru ha bụ Daniel Ndukwe binyere aka n’ụbọchị Satọde 17 n’afọ 2024, ma kwuo na ha zọpụtara mmadụ abụọ n'ime mmadụ ise ndị ntọ ahụ tọọrọ na mbụ.
Ndị uweoji sịrị na ọ bụghị ọtụtụ mmadụ ka atọorọ dịka ozi dị na soshal mịdịa sị ekwu.
Ha gara n’ihu sị na kọmịshịọna ndị uweoji na steeti ahụ bụ Kanayo Uzuegbu enyeela iwu ka azọpụta mmadụ atọ ndị nke ọzọ nọ na-aka ndị ntọ.








