Gọọmentị Abịa amalitela nkwatu ụlọ gbajọrọ iwu

Gọọmentị Abịa steeti amalitela ikụrụ ụlọ na ewumewu ndị gbajọrọ iwu n'Okpuru Ọchịchị anọ na steeti ahụ ụbọchị Wenezde.
Nkwatu ụlọ obibi,ọdọahịa, ọdọ mmanụ ụgbọala na ewumewu ndị ọzọ nke ndị Odeakwụkwọ Ukwu Okpuru Ọchịchị hụrụ maka ya mere n' Okpuru Ọchịchị Osisioma, Aba North, Aba South na Obingwa.
Onye ntaakụkọ anyị gara hụ etu ya bụ ihe siri gaa kwuru na ndị ọrụ gọọmentị ahụ gbachiri ọdọ mmanụ ụgbọala a ma ama n'Onwuka Nails dị n' Okporoụzọ Awara Awara si Aba gawa Enugwu na Potakọt maka iwu ewumewu na anataghị ikike.
A gbachikwata ọdọ Gaasị dị nokporoụzọ 'Udeagbala Road' maka na e wuru ya n'elu ọgboroigwe mmanụ ụlọọrụ NNPC nakwa ọdọ gaasị dị n' Immaculate, ebe Waterside bụ nke agbachiri maka ịdị n'okporo ụgbọ oloko.
A gbachikwara ọdọa ahịa dị 26 bụ ndị a rụrụ n'okpuru nnukwu na nso ụlọụka 'Saint Silas Anglican Church, Ayaba-Umueze ' maka ịdị ebe dị njọ mmadụ ịnọ.

N'Okpu-Umuobo Comprehensive Secondary School dị n'Okpuru chịchị Osisioma Ngwa, a kwụsịrị ọrụ nke 'National Agricultural Land Development Authority' (NALDA) na-arụ ụlọ mmụta nakwa obere amaegwụregwu maka anataghị ikike site na ngalaba nhazi obodo.
N'Okpuru Ọchịchị Aba-South, a kpọchiri ụlọelu ogogo anọ ebe ọrụ na-aga nakwa ọzọ a na-arụ ụlọ n'ebe ụlọakwụkwọ 'Azikiwe Road Primary School' dị.

Onye nhazi obodo bụ Chigoziri Ahaiwe kwuru sị, "Anyị akpagharịala ọtụt ebe were hụ na o nweghị nke natara akwụkwọ ikike ịrụ ihe ọbụla."
"Ụfọdụ rụrụ n'okpuru waya ọkụ latrik, ụfọdụ anyị kwaturu bụ n'elu okporo mmanụ gaasị ka a rụrụ ha."
"Ịmakwa ihe bụ na mmadụ rụrụ ụlọ n'elu okporo gaasị?"
"Ndị mmadụ na-arụ ihe etu masịrị ha na-anataghị ikike."
"Gọọmentị sị mba. Ọ bụrui na anyị chọrọ ka obodo dị mma, anyị ga-ekpocha ya."


Ọ gara n'ihu rịọ ndị obodo ka ha gaa nata ikike tupu ha etinye ego n'iwu ihe ọbụla.
"E nwere ebe ndị anyị agaghị enye ikike ka ewuo ọdọ mmanụ ụgbọala"
Anyị asịghị gị ewula ụlọ mana e nwere ihe a mapụtaara ebe dị iche iche"
O kwuru na atụmatụ ahụ ga aga nihu dịka ha nwere atụmatụ ịkwatu ihe ọbụla e wuru n'elu ọwa mmiri.









