Kedụ mba ndị nọ na Commonwealth nke Eze Charles III bụ onyeisi ya?

Eze Charles III

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Eze Charles III bụ onyeisi otu Commonwealth nke mba 56 nọ n'ime ya tinyere Naịjirịa

Ndị isiala mba dị icheiche nọ n'otu Commonwealth gbakọrọ na London mba UK n'ụbọchị Satọde iji sonye n'Emume Ichieze nke Eze Charles III, onye bụkwa onyeisi otu ahụ.

Ụfọdụ mba nọ n'otu Commonwealth bụ ndị mba Briten chịburu n'oge ọchịchị ndị ọcha a na-akpọ 'colonial era', ndị ọzọ bụ ndị mba Briten ka na-achị ruo taa, ebe olemole bụ ndị na-enwebughi ihe ọbụla jikọburu ha na Briten mana ha nwere mmasị isonye n'otu ahụ.

Lee ihe asaa i nwereike ịmabughị gbasara otu Commonwealth.

1) E kee mmadụ niile nọ n'ụwa ụzọ atọ, otu ụzọ bi na mba Commonwealth

Ọnụọgụgụ ndị mmadụ bi na mba Commonwealth

Ọnụọgụgụ mmadụ bi n'ụwa bụ ijeri asatọ na ụma. N'ime ọnụọgụgụ a, ndị mmadụ bi na mba Commonwealth dị icheiche dị ebe ijeri 2.5.

Ihe karịrị pasentị 60 ndị mmadụ bi na mba Commonwealth dị icheiche dị afọ 29 maọbụ ha erubeghị ya.

Otu ụzo n'ụzọ atọ ndị ntorobịa niile n'ụwa nọ n'agbata afọ 15 na 29 bi na mba Commonwealth.

2) Eze Charles abụghị onyeisiala na ọtụtụ mba Commonwealth

Mba ndị so na Commonwealth

N'ime mba 56 nọ n'otu Commonwealth, Eze Charles bụ onyeisiala na 15, ndị ọzọ nwere ndị isiala maọbụ eze nke ha. Barabados bụ mba nke ikpeazụ wepụrụ Eze England dịka onyeisiala ha n'afọ 2021.

Mba Commonwealth ebe Eze Charles bụ onyeisiala gụnyere: UK; Australia; New Zealand; Canada; Jamaica; Bahamas; Belize; Grenada; Papua New Guinea; Saint Kitts na Nevis; Saint Lucia; Saint Vincent na Grenadines; Solomon Islands; na Tuvalu.

Ọ bụ eziokwu na a na-ahụta Eze Charles dịka onyeisiala na mba ndị a, mana ọ pụtaghị na ọ bụ ya na-achị ebe ahụ. Ọkwa ahụ bụ naanị iji gosi nkwanye ugwu, maka na mba ndị a nwere usoro ọchịchị nke ha.

Mba ndị dịka Lesotho, Eswatini (a na-akpọ Swaziland), Brunei Darussalam, Malaysia na Tonga, nwere eze nke ha. Ndị ọzọ nwere onyeisiala na-achị ha.

3) Ụfọdụ mba nọ n'otu Commonwealth enwebughị mmekọrịta ọbụla ha na

Rwanda

Ebe foto si, Reuters

Nkọwa foto, ndị ọcha chịrị mba Rwanda n'oge gara aga bụ ndị Germany na Belgium, mana Rwanda so n'otu Commonwealth
Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Mozambique sonyere otu Commonwealth n'afọ 1995, Rwanda sonyere na 2009, mana mba abụọ enwebụghị mmekọ ọbụla ha na mba Briten nwere n'oge gboo.

Ndị ọcha chịburu mba Rwanda bụ ndị Germany na Belgium.

Mba Gabon na Togo - ndị mba Fransị chịburu n'oge ọchịchị ndị ọcha - batakwara n'otu Commonwealth n'afọ 2022.

Ụfọdụ mba apụkwaala na ya bụ otu, dịka mba South Afrịka n'afọ 1961 oge ndị otu Commonwealth katọrọ ha maka ọchịchị ịkpa oke agbụrụ a kpọrọ 'apartheid'. Ha mechara laghachikwa n'otu ahụ na 1994.

N'afọ 1999, a chụpụrụ mba Pakistan n'otu Commonwealth dịka ndị agha weghaara ọchịchị n'ike na mba ahụ, mechaa nabata ha n'afọ 2004, mechakwaa chụpụ ha n'etiti 2007 na 2008.

Aka chịburu mba Zimbabwe bụ Robert Mugabe wepụrụ mba ya n'otu ahụ n'afọ 2003 dịka a katọrọ ya maka ebubo ime nrụrụaka na ntuliaka. Na 2018, Zimbabwe tinyere akwụkwọ ịlaghachi na Commonwealth, mana ekpebibeghị ya bụ okwu ruo ugbua.

Mba ikpeazụ pụrụ na Commonwealth bụ Maldives na 2016, mana ha mechara batakwa ọzọ na 2020.

4) Otu Commonwealth buru ibu

Canada
Nkọwa foto, Canada bụ mba kacha buo ibu n'ime otu Commonwealth

Otu ụzọ n'ime ụzọ anọ ala niile dị n'ụwa dị na mba Commonwealth.

Canada bụ mba kacha buo ibu n'otu ahụ dịka ọ bụ mba nke abụọ kacha buo ibu n'ụwa. India na Australia bukwara ibu.

Mana ọtụtụ mba ndị so n'otu Commonwealth pere mpe. Mba 42 n'ime mba ndị kacha nta n'ụwa nọ n'ime Commonwealth.

5) UK abụghịzị mba ka bụrụ ọgaranya

Otu Commonwealth

UK bụ mba ọnọdụ akụnụba ha kachabu mma n'ime otu Commonwealth, mana mba India gafere ha n'afọ 2022 dịka ngụkọ nke otu IMF si gosi.

Naịjirịa bụ mba nke ise ka bụrụ ọgaranya n'ime mba 56 nọ na otu ahụ.

Mgbakọta GDP nke mba 56 so n'otu Commonwealth karịrị tarị dọla 13 ($13tn maọbụ £10.8tn). Nke a karịrị ugboro abụọ akụnụba mba Japan ($5tn maọbụ £3.75tn), mana o rughị akụnụba mba Amerịka ($23tn maọbụ £17.2).

6) Ọ gbanweela aha

Ndị ọchịchị mba so n'otu Commonwealth na London n'afọ 1965

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ndị ọchịchị mba so n'otu Commonwealth na London n'afọ 1965

Naanị mmadụ atọ rụrụla ọrụ dịka ndị isi otu Commonwealth - Eze George VI, Ezenwaanyị Elizabeth II, na Eze Charles III. Ọkwa a anaghị esi na nne na nna gafeere nwa, mana otu Commonwealth kpebiri ịnabata Eze Charles dịka onyeisi ha n'afọ 2018 oge ọ ka bụ Ọkparaeze nke Wales.

Isi ụlọọrụ otu a dị na London, onye na-elekọta ya bụ 'Secretary-General' nke onye ji ọkwa ahụ ugbua bụ Baroness Scotland. A họpụtara ya ka ọ chịa nke ugboro abụọ n'ọnwa June 2022.

Mba ndị so hibe otu Commonwealth bụ Australia, Canada, India, New Zealand, Pakistan, South Afrịka na Sri Lanka.

Mana ọtụtụ na-ekwu na otu ahụ enweghịzi uru ọbụla ọ bara n'ụwa ọgbara ọhụrụ a, kama ọ bụ otu mba Briten ka ji jide mba ha chịburu n'oge gboo.

7) E nwere otu ọzọ a na-akpọ commonwealth

Vladmir Putin

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Onyeisiala mba Russia bụ Vladmir Putin bụ onyeisioche otu a kpọrọ 'Commonwealth of Independent States'

Mba Russia na ụfọdụ mba ndị nọbụ n'okpuru 'Soviet Union' bịakọtara ọnụ n'afọ 1991 wee hibe otu ha kpọrọ Commonwealth of Independent States.

Ha kwuru na otu a bụ iji kwalite azụmahịa, nchekwa, ime njem, na mkparịtaụka n'ime onwe ha, mana nke a adịbeghịrị ha mfe imejupụta.

Georgia wepụrụ onwe ha n'otu ahụ n'afọ 2009 dịka Russia weghaara ala ha dị na mpaghara South Ossetia n'ike. Ukraine pụkwara n'otu ahụ n'afọ 2018.