Lee ọnọdụ ụzọ 9th Mile-Opi Nsụka ebe ụgbọala na-akwụ n'ahịrị izuụka abụọ


Ụzọ awara awara si Enugwu aga Nsukka nakwa mgbago ugwu ala Naịjirịa emebiela nke ukwuu, nke na ụgbọala gwongworo na-anọru otu izụka ma ọ bụ abụọ tupu ha agafee ebe ahụ.
Nsogbu ụzọ awara awara si Enugwu aga Nsukka malitere ihe kariri afọ iri gara aga wee rute ugbua ọ bụzị aga aga.
Cheta na Gọmenti Sullivan Chime rụrụ ụzọ ọhụrụ si Enugwu gaa Nsukka nke a kpọrọ Ugwogo-Opi-Nsukka Rd n'afọ iri na ise gara aga.
Ọchịchị Sullivan weere ihe mechie ya bụ ụzọ ka nnukwu ụgbọala dịka gwongworo na 'trailler' na ụgbọala ukwu ndị ọzọ ghara igafezi ebe ahụ.
Nke a mere ha jiri sowezia ụzọ nke awara awara ochie.
Nsogbu pụtazịrị bụ na ụgbọala ukwu ruru narị kwụrụ narị tọrọ na ya bụ ụzọ n’ihi ajọ ụzọ.


Ndị ọkwọ ụgbọala akwaala arịrị na ha na-atakụta ya aja n’ụzọ si Enugwu aga Nsụka.
BBC gara n'ụzọ ochie si Enugwu gaa Nsụka wee hụ narị kwụrụ narị ụgbọala ukwu kwụrụ na ahịrị eche oge ha ga-amalite njem.
Anyị gbara ọtụtụ n’ime ha nọrọla otu izu ụka n’eche oge ajụjụọnụ.
Chukwudi Okonkwo na Fidelis Onu bụ ndị na-akwọ ụgbọala 'trailler' kọwara ka ha si were ego niile ụlọọrụ ha nyere ha na-eri nri n’ụzọ, nke mere na ha enwezighi ike inye ndi ezi na ụlọ ha nri maka na ihe siri ike.
Maazi Fidelis Onu kwuru na ihe ya bu bụ nri wee kwaa arịrị na oke anwụ nwere ike imebi ya.
Ọkwọ ụgbọala onye ugwu bu tomato kwara arịrị na kwamgbe ka tomato ya bu na-ere ere ghọrọ awara awa tupu o rue ebe a ga ere ya n’ihi ọtụtụ ụbọchi ọ nọrọ n'ụzọ ọjọọ ahụ.

Kedụ ka o si emetụta ndị obodo nọ gburu gburu ahụ?
Obodo nọ n'ogologo ụzọ ahụ bụ ndị ojebe ogene gunyere Abọ, Ọkpatụ, Ọhum, Ụmụlumgbe, Ụmụọka na Ukehe.
Ụkọchukwu na-elekọta ụlọụka katọlik St Anthonys' Parish Ụmụlụmgbe bụ Fada Kenechukwu Onoh gwara BBC na ya na ndị bi n'Ụmụlụmgbe na-ata nnukwu ahụhụ maka ụzọ ọjọọ ahụ.
Fada Onoh kwuru na kwa mgbe ka ụgbọala ji adachi ihu ụlọ ụka ya ma mee ka ndị mmadụ ghara ịbịa ụka, nwekwaa mgbe ụgbọala ukwu 'trailler' na-enwe ihe mberede okporoụzọ ebe ahụ ma dachie ihu ụlọ ụka.
Ọ rịọrọ gọọmenti etiti ka ha gbatara ha ọsọ enyemaka. Ka ndị Ọkpatụ na-ebe bụ ka ndị Ọhụm, Ụmụlụmgbe, Ukehe, na Ụmụọka si arịokwa gọọmentị ka o meere ha ebere makana ila n’ụlọ ha bụzị ihe na-ahịa ha ahụ nke ukwuu.

Kedụ oge a rụrụ ụzọ ahụ mebicharala?
Ụzọ ahụ si 9th Mile aga Makọdị bụ nke a kpọrọ Enugu-Markudi expressway bụ ụzọ ruru kilomịta 300 na-ejikọ mpaghara ọwụwa anywanụ na mpaghara ugwu Naịjirịa.
Nri niile si na mpaghara ugwu aga mpaghara ọwụwa anyanwụ na-esi mpaghara ugwu dị icheiche agbadata site Makọdị na Benue Steeti banye Obolo-Afọ dị n'Enugwu wee rue 9th Mile, sizie na 9th Mile banyezie mpaghara ọwụwa anyanwụ ndị ọzọ.
Gọọmentị etiti Naịjirịa rụrụ ụzọ ahụ n'afọ 1960 mana gọọmentị ndị dị icheiche anaghị ahazi ya etu o kwesiri. E ji ya achụ nta vootu mana o mechaa, a naghị arụ ọrụ na ya.
Ọtụtụ oge ka gọọmentị nyere ọrụ ahụ n'aka ndị ọrụ. Gọọmentị onyeisiala Buhari nyekwara ọrụ ụzọ ahụ n'aka ndị ọrụ mana nwaoge a malitere ịchụnta vootu maka ntuliaka 2023, ọrụ kwụsịrị na ya bụ ụzọ ruo ugbua a naghị agalizi ya aga.
Gọọmentị Enugwu n'ọchịchị Ifeanyi ugwuanyị malitere n'Opi rụọ ụzọ ahụ banye Udenu mana malite Opi laghachi 9th Mile, e metughi ya aka cha cha.









