Ndị ojiegbe agbagbuola mmadụ isii na mpaghara Garki dị n’Okigwe, Imo Steeti

Ndị ojiegbe ndị awakpoola ma gbagbuo mmadụ isii na mpaghara a kpọrọ Angwa Garki dị n’okpuruọchịchị Okigwe, Imo Steeti.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n’Imo Steeti bụ Henry Okoye gwara BBC na nke a bụ eziokwu, na o mere n’ụtụtụ ụbọchị Wenezde.

Ọ gbakwụnyere na ọ bụ ihe mwute nakwa ihe anya mmiri.

Otu anya hụrụ ka ihe si mee kwuru na ndị ojiegbe ahụ wakporo ogigi a n’ihe dịka elekere iri na abụọ nke isi ụtụtụ (12am) ma malite ịgba egbe aghara aghara.

“N’isi nkụ ụtụtụ ụbọchị Wenezde n’ihe dịka elekere 12, anyị malitere ịnụ ụda egbe aghara aghara na mpaghara Garki, bụ nke nọrọ ihe ruru otu awa,” ka anya hụrụ ka o si mee si kwuo.

“Anyị nụkwara ụda egbe ọzọ n’elekere 9 nke ụtụtụ n’otu Garki ahụ, nke mere onye ọbụla jiri gbaa ọsọ.

“E kwuru na ndị ojiegbe bịara mụnyere ụfọdụ ụlọ dị na Garki ọkụ ma malite ịgba ndị mmadụ egbe. Eche m na e gburu ihe ruru mmadụ asaa. Onye ọbụla na-ezerezi isi onwe ya kamgbe ahụ.

“Akụkọ kwuru na ndịagha Naịjirịa wakporo ogige ndị ojiegbe a n’ụbọchị Satọde gara nke mere ha jiri bịa njem mmegwara n’Ama ndị Hausa.”

Okoye kwuru na ngwa ngwa ha nwetere ozi banyere nke a, kọmishọna uweojii zipuru ndị ọrụ ha ka ha wuchie ebe ahụ ma malite ịkpagharị n’ogige ahụ.

O kwuru na ha nwuchiela ụfọdụ ndị a na-enyo enyo na aka ha dị n’arụ a, ma gbakwụnye na ndị a ga-enyere ha aka na nyocha ha na-eme.

O kwuru na e burula ozu ndị nwụrụ anwụ dowe n’ụlọ ebe a na-achekwa ozi ebe ndị merụrụ ahụ na-anata ọgwụgwọ n’ụlọọgwụ.

“Mmadụ isii nwụrụ na mwakpo a, e burula ozu ha gaa n’ụlọ ebe a na-echekwa ozu.”

“Anyị na-eche na ndị kpara arụ a bụ ndị otu IPOB maọbụ ESN. Anyị na-arịọ ọhanaeze ka ha nyere anyị aka n’ịchọpụta ndị a site n’izitere anyị ozi.”

“Kọmishọna uweojii gbarụrụ ihu n’ihi mwakpo a ma na-ekpe ekpere ka mkpụrụobi ndị a laa na ndokwa.”

Okigwe so n'otu n'ime ebe ndị ojiegbe kachasị akpa ike na n'Imo steeti nakwa mpaghara Ọwụwa Anyanwụ.

E nweela ọtụtụ akụkọ ntọrị mmadụ, mwakpo ndị mmadụ nakwa ndị ọrụ nchekwa dị iche iche kamgbe afọ ole ma ole gara aga.