'Ndị uweojii ịkpọpụta ndị a na-enyo maka mpụ n'ọha megidere iwu'

Ebe foto si, Getty Images
Ụlọikpe n'Abuja kpebiri ka ọnyeịsị ụweọjịi Naịjịrịa kwụọ nwunye M.K.O Abiola bụ ọkammuta, Zainab Abiola ego ruru N52m maka inwuchi ya na ịgọsịgharị ya ọha ebe o yi naanị uwe abalị.
N’ikpe ahụ nke Justice Modupe Osho-Adebiyi nyere, o nyekwara ndị uweojii iwu ka ha rịọ Abiola mgbaghara n’akwụkwọ akụkọ abụọ a mara ama na Naịjịrịa.
Abiola kpụpụrụ ndị uweojii ahụ n'ụlọikpe n'afọ 2022 'ebubo na ha wakporo ụlọ ya dị n'Abuja ma jide ya ka ọ yi uwe abalị wee kpụrụ ya bata n'ụlọọrụ ha. O kwuru na ha megidere ugwu na ikike dịịrị ya.
Ajụjụ onye ọbụla kpụ n'ọnụ bụ ma iwu akwadoro ndị uweojii igosigharị ndị a nwụchiri a na-ekpebeghi ikpe?
Iwu akwadoro ndị uweojii igosigharị ndị a nwụchiri a na-ekpebeghi ikpe?

Ebe foto si, Getty images
Anyị na ọkaiwu Peter Aja kpara maka okwu a, ọ kọwara na igosịgharị onye a na-enyo enyo ka uwa hụ ya putara na e kpezugo ikpe ahu, na ọbaghịzị ụrụ ịje ụlọ ịkpe.
N'okwu ya; “ihe gbasara igosigharị onye a na-enyọ enyọ ka uwa hụ ya tupu ụlọịkpe ekpebịe ịkpe ya bụ ihe iwụ na-achị Naịjịrịa amaghị maka ya maka na usoro ikpe na Naịjịrịa kwuru na aka onye a na-enyo enyo ka dị ọcha rụọ mgbe ụlọikpe kpebiri ikpe ya, maa ya ịkpe”.
Ọ gara n'ihu kwuo, “onye ọbụla na-egọsịgharị onye a na-enyo enyo amaala ya ịkpe, maka na ihe ị na-agwa uwa nile bu na onye a dara iwu mere i ji egọsị ihu ya”.
“Ọ dị njọ ndị uweọjịi maọbụ ndị ọzọ ị na-egọsịgharị ihu mmadụ, ghara ije ụlọikpe na mbụ ebe a ga-ekpe ikpe ma kpebie ya”.
Gịnị ka iwu kwuru?
Ngalaba 36 akwụkwọ iwu Naịjirịa kwuru na aka mmadụ dị ọcha ruo mkpe ụlọikpe kpebiri na o mere ihe ọjọọ ọbụla. Dịka ọkaiwu Peter siri kwuo, "ịgbọpụta mmadụ n'ọha na-ekpe ya ikpe n'ihu ndị ntaakụkọ oge ụlọikpe ekpebeghi ya ikpe bụ imegide ugwu na ikike dịịrị onye".
Ọ gara n'ihu kwuo ka ndị uweojii na ndị ngalaba nchekwa ndị ọzọ niile kwusị ụdị agwa ahụ dịka o megidekwara iwu ugwu na ikike dịịrị onye nke African Charter on Human and Peoples Rights Act.









