Etu ndị ojiegbe ruru 30 si wakpoo ụlọọrụ ndị uweojii, gbaa ya ọkụ n'Ondo steeti

Ndị ojiegbe ruru mmadụ iri na atọ wakporo ogige ndị uweojii n'Ondo steetị ma gbaa ya ọkụ, ma gbaa ụgbọala ha ọkụ.
Nke a mere n'ụbọchị ikpeazụ(31) nke ọnwa Desemba 2025 n'Ipele dị n'Okpuru Ọchịchị Owo, Ondo steetị.
A sị na mkpamkpa a bidoro na mgbede ụbọchị ahụ dịka ndị mmadụ na-akwado iga ulouka maka ekpere afọ ọhụrụ.
Ọ bụ oge ahụ ka ndị ojiegbe wakporo ha ma bido na-agba egbe aghara aghara.
Ndi obodo niile gbara ọsọ ndụ ha mgbe ha chọpụtara ihe na-eme.
Etu o si bido
Kehinde Olutimehin gwara BBC na ya na-aga ịzụta mmanya na ihe ya na ndị ọnyị ya ga-eji nwe aṅụrị maka aha ọhụrụ mgbe ya nụrụ ụda egbe.
Kehinde kwuru na mbụ na ya chere na ọ bụ ihe "egbe ọkụ a na-agba n'igwe" (knockout) maọbụ ihe egwuregwu, mana nwa ntiti oge ha achọpụta na ọ bụ ụda egbe.
Ọ si na 'ndị niile nọ n' ebe ụlọ ndị uweojii gbara ọsọ gbalaga.
Ọ kọwara na ndị ojiegbe ahụ kwara mgbọ aghara aghara n'ọgige ndị uweojii tupu ha amụnye ya ọkụ.
Otu onye na-achọghị ka a mara aha ya kwuru na ụmụnwaanyị ndị uweojii abụọ nọ n'ụlọọrụ ha mgbe ndị omekome ahụ bịara mana ha gbara ọsọ.
Nkọwa ndị uweojii nyere
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii bụ na steeti ahụ bụ Abayomi Jimoh kwuru na mwakpo a wakporo ụlọ ndị uweojii ahụ bụ eziokwu.
Ọ gwara ndị ntaakụkọ na ndị omekome ahụ ruru mmadụ iri atọ.
Ọ sị na ha ji egbe gbakasịa ebe ahụ tupu ha tụnye ihe dara ka ogbunigwe.
Ọ sị na ha mụnyere ọtụtụ ihe ndị uweojii ọkụ.
Ndị ojiegbe n"Ondo Steeti a wakporo ụlọụka?
Dịka akụkọ na-efegharị na ndị ojiegbe ahụ ruru mmadụ iri atọ wakporo ụlọụka n'Ondo steeti mana ọnụ na-ekwuru ndi uweojii na steeti ahụ bụ Abayomi Jimoh kwuru na ọ bụ okwu asị.
Ọ sị na "ọ bụ asị ọcha na ndị mmadụ na-ekwu na a wakporo ụlọụka".
Jimoh gara n'ihu kwu na enweghị mmadụ ọbụla e gburu na mwakpo ahụ.
O kwuru na mgbe ndị ọrụ nchekwa dị icheiche nakwa ndịagha Naịjirịa jiri jịkọta onwe ha ma gaa n'ebe mkpamkpa ahụ na-akpa na ndị ojiegbe ahụ agbaala ọsọ gbalaga.
N'okwu Jimoh "Komishịọna ndị uweojii na steeti ahụ bụ Adebowale Lawal katọrọ mwakpo ahụ ma kọwaa ya dịka ime ka egwu na-atụ ohanaeze".
Ọ kwere ndị obodo Hilepe nakwa agbata obi nkwa nae zi nchekwa dị na mpaghara ahụ ugbua.









