Etu ndị na-atụ mgbere mmadụ si eji ndị nwere nkwarụ akpa ego ọjọọ

Aha onyonyo, African Eye: Etu ndị na-atụ mgbere mmadụ si eji ndị nwere nkwarụ akpa ego ọjọọ
Etu ndị na-atụ mgbere mmadụ si eji ndị nwere nkwarụ akpa ego ọjọọ

Ọtụtụ oge ka ị na-ahụ ndị nwere nkwarụ ka ha na-arịọ arịrịọ n'okporoụzọ, mana ebee ka ha si?

Nnyocha nke BBC African Eye mere na mba Kenya egosila etu ndị ekperima na-atụ mgbere mmadụ si eji ndị nwere nkwarụ akpa ego ọjọọ.

Otu nwoke aha ya bụ Zenge, onye bụkwa onye nkwarụ, so n'otu n'ime ndị isii otu ọjọọ a.

Ndị otu a na-aga na mba Tanzania, gakwuru ezinụlọ nwere onye nkwarụ ma kwe ha nkwa ego iji kpọrọ nwa ha.

Ha ruo na Kenya, ha na-amanye ụmụaka ndị a ka ha na-arịọ arịọrịọ n'okporo ụzọ ma na-ewetara ha ego.

Ụmụaka a rịọchaa arịrịọ n'ụbọchị, ha na-alaghachi n'ogbe a kpọrọ Kariobangi, bụ ogbe ndị dara ụbịam bi na Kenya.

Fara

Ụfọdụ n'ime ha ka nna ha ukwu bụ Zenge na-enyetụ obere ego n'ime ego ha rịọtara n'ụbọchị, mana ụfọdụ ndị ọzọ, dịka otu onye nkwarụ aha ya bụ Fara, ọ naghị enye ya ihe ọbụla.

Fara na-arịọta ihe dịka puku shiling abụọ kwa ụbọchị, maọbụ dọla iri na asatọ.

N'ihe onyonyo a, onye ntaakụkọ BBC ji ụzọ nzuzo nweta ihe akaebe gosiri etu e si eji ndị nkwarụ akpa ego, ma na-emekpakwa ha ahụ n'elu ya.