Ihe Onyeisiala Buhari na Boris Johnson kpara maka Nnamdi Kanu ụnyaahụ

Muhammadu Buhari na Boris Johnson

Ebe foto si, Femi Adesina/Facebook

Onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari na Praịm minista mba Briten bụ Boris Johnson nwere mkparịtaụka pụrụiche n’ọgbakọ ndịisi mba nọ n’okpuru Commonwealth (Commonwealth Heads of Government Meeting CHOGM) nke ugboro 26, nke a na-eme n'isiobodo Kigali, mba Rwanda.

Mkparịtaụka ha rụtụrụ aka n’ọtụtụ ihe nke gụnyere okwu Nnamdi Kanu bụ onye ndu Indigenous People of Biafra (Ipob) gọọmentị Naịjiria nwụchiri, ọnọdụ nchekwa na ndị ọzọ.

N’okwu banyere Kanu, Buhari gwara Johnson na ọ bụghi eziokwu na ha ekweghi Kanu hụ ndị ọkaiwu ya.

Ọ sị na gọọmentị ya na-enye Kanu ohere ọbụla iwu kwadoro “n'agbanyeghi ihe ọjọọ ndị o kwuru megide gọọmentị mgbe ọ nọ Briten.

"Ọ nọ na mba Briten ebe o che na onweghi ihe ga-eme ya, na-ekwu ihe ọjọọ gbasara Naịjiria. Anyị mechara nweta ya mgbe o si na Briten pụta, ma kpụga ya ụlọikpe.

"Ya gaa zara ọnụ ya n'ihe niile o kwuru ebe ahụ. Ndị ọkaiwu ya na-ezuteli ya. Chetakwa na ọ gbaburu ọsọ n'ikpe a na-ekpe ya mgbe a tọhapụrụ ya nwamgbenta, kedụ etu anyị ga-esi mara na ọ gaghị emekwa ya ọzọ ma ọ bụrụ na a tọhapụkwa ya nwamgbenta ọzọ?"

Ihe ndị ọzọ Buhari na Johnson kpara

  • Buhari ọ ga-adọtikwu ọchịchị ya ruo afọ anọ ọzọ (third term)?

Buhari gwara Johnson na ọ ga-akwanyere iwu Naịjiria kwuru na onyeisiala ga-achị naanị afọ anọ ugboro abụọ, ugwu. O kwuru na ọ gazirighi onyeisiala nke nwaburu ịdọtị ọchịchị ya ọfụma.

  • Gbasara enyemaka Johnson chọrọ inyere Naịjiria na nchekwa:

Onyeisiala Buhari kwuru na inyere mba Libya aka ihazigharị ndụ ha nwereike ịdịrị ha mma, dịka o kwuru na ọdịda ọchịchị Muammar Gadaffi chịrị mba ahụ afọ 42 tupu ọ nwụọ, mere ka ndị agha ya na-akpa mkpamkpa na mpaghara Afrịka.

O kwuru na "ha na-akpa mkpamkpa ebe niile dịka naanị ihe ha ma bụ etu e si agba egbe."

  • Gbasara Boko Haram:

Onyeisiala Buhari kwuru na ha na-agbasi mbọ ike inye ndị mmadụ nkuzi na ọ bụ naanị onye achịkọta ekwe ọnụ ga-egbuli onye na-enweghi ihe o mere ya, ma na-ekwu "Allah Akbar (Chineke dị ebube). Chineke bụ ikpenkwụmọtọ. Ị gaghị egbu ndị aka ha dị ọcha ma sị na ị na-emere ya Chineke.

"Ya bụ nkuzi arụwala ọrụ, ndị mmadụ aghọtala ugbua na Boko Haram anaghị eso ụzọ Chineke, ọ bụghị ihe gbasara ofufe."

Ihe Johnson kwuru

Johnson na onwe ya kwuru na obi dị ya ụtọ n'oziọma ọ natara banyere azụmahịa n'etiti mba abụọ a.

O kwuru na mmekọrịta mba abụọ a siri ike, ma kwuo "Achọrọ m ịma ma na anyị na-eme ọfụma. Ọ bụ nnukwu mmekọrịta nye anyị, anyị achọghị imefu ya."

O tinyere na Briten ga-ebutukwu ụgwọ a na-akwụ n'ụfọdụ ngwaahịa na-aga Naịjiria.