You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Tuberculosis symptoms: Etu m si rịa ọrịa ụkwaranta afọ iri na anọ na-achọpụtaghị - Janet
- Onye dere ya, Chimezie Ucheagbo, Okechukwu Omeire & Chigozie Ohaka
- Ndị mere akụkọ a, Senior Journalist, Video Journalist & Producer
- Ebeg o si, Lagos
Dịka mbaụwa weere ubochị 24 nke ọnwa Maachị afọ ọbụla echeta ọrịa ụkwaranta, Janet Iyiola so na ụfọdụ ndị ji ọṅụ echeta ya bụ ụbọchị.
Janet dara ọrịa a gbagwojuru ya anya n'afọ 2009, ọ gara ụlọọgwụ ma gakwaa ebe ndị ọzọ mana ọ chọpụtaghi ihe na-arịa maọbụ nwete ọgwụgwụ.
Ọrịa a mere ka Janet daa ngwọrọ ma na-enwe ihe mgbu n'ụkwụ nakwa n'ukwu ya.
Ọnọdụ Janet bidoro ịgbanwe mgbe ọ nụrụ ozi n’igwe redio nke na-akọwa njirimara dị iche iche e ji maara ọrịa ụkwaranta a kpọrọ 'tuberculosis' na bekee.
Ọ kpotụụrụ ụlọọrụ na-agbasa ya bụ ozi ma kọọrọ ha etu ahụ si eme ya. Ha gwara ya bịa n'ụlọọgwụ ka ha nyochaa ya ahụ.
Mgbe ọ gara, ha nyochara ya ahụ ma chọpụta na ọ bụ ọrịa ụkwaranta nke na-emetụta ọkpụkpụ azụ ka ọ na-arịa.
Ha bidoro inye ya ọgwụ na-atufughi oge. Dịka otu afọ gachara, Janet agbakewala nke bụ na ọ malitela ịga ije ugbua ma na-emekwa ihe ndị dị iche iche dịka isi nri na ihe ndị ọzọ nke ọrịa a ekweghi ya mee na mbụ.
Onye ọrụ ahụike na-enye Janet ọgwụ bụ Ajayi Oluyinka gwara ndị mmadụ ka ha ejile ọrịa ụkwaranta egwu egwuregwu n'ihi na o nwere ike igbu mmadụ.
Ọ gara n'ihu kwuo na onye nwere njirimaara ọrịa ụkwaranta n'ahụ, biko gbapụ ọsọ gaa n'ụlọọgwụ mee nyocha ma nata ọgwụgwụ.
Kirie ihe a ka ị nụ akụkọ a n'uju;