'E ji m ude ọcha mebie akpụkpọahụ ụmụ m'
Ezigbo iwe na-ewe otu onye nne na mpaghara ugwu Naịjirịa dịka o ku nwa ya dị afọ abụọ, bụ onye ọkụ ude gbara akụkụ ihu ya na ụkwụ ya.
Nwaanyị ahụ dị afọ iri atọ na abụọ (32) tere ụmụ ya isii ude ọcha n'ihi omume ọjọọ ndị ezinaụlọ ya na-emeso ha.
Fatima a gbanwere aha ya iji mee ka mmadụ ọbụla ghata ịmata ya na ezinaụlọ ya kwuru na otu n'ime ụmụ ya ndị nke nwaanyị na-emechi ihu ya oge ọbụla ọ na-apụ iji kpuchie ọkụ ude gbara ya.
Onye nke ọzọ ka akpụkọahụ ya dizi ojii karịa etu ọ dị na mbụ, tinyere okirikiri ọcha dị ya n'anya, ebe nwa ya nke atọ nwere apa ọcha n'egbugbereọnụ ya nakwa n'ikpere ya.
Nwa ya nke o ku n'aka ka nwere ọnya n'akụkpọahụ ya nke na-ekweghị ala.
"Nwanne m nwaanyị mụrụ ụmụ ọcha mana ụmụ nke m adịghị ezigbo ọcha. A chọpụtara m na nne m kahasị eleta ụmụ nwanne m anya karịa ụmụ nke m n'ihi na ha adịghị ọcha. ọnọdụ ahụ na-ewute m nke ukwuu," ka Fatima kwuru.
Ọ sị na ya zụtara ude n'otu ụlọahịa dị n'obodo Kano na-anataghị ntụziaka dọkịta ma were ya na-ete ụmụ ya.

Na mbụ, ọ dị ka ọ na-arụ ọrụ. Nne nne ha malitere ịhụ ụmụ Fatima n'anya, ndị dị afọ abụọ ruo iri na isii (16) n'oge ahụ.
Mana tupu a mara nke a na-eme, ọ malitere ịgba ha ọkụ ma na-ebutekwa apa n'akụkụ ahụ ha dị iche iche.
A na-ete ude ọcha n'akụkụ ụwa dị iche iche mana nke bụ eziokwu bụ na ụfọdụ n'ime ha gbakwasara ụkwụ n'omenala.
ụmụnwaanyị Naịjirịa kachasị ete ude ọcha na mba Afrịka dịka ihe ruru pasenti iri asaa na asaa 77% na-ete ya oge niile dịka ụlọọrụ ahụike mbaụwa bụ WHO siri kwuo.
Na Kongo Brazavil pasenti ha dị 66%, Senegal dị 50% ebe Gana dị 39%.
Ude ndị ahụ pụrụ inwe corticosteroids maọbụ hydroquinone, nke nwereike ibute nsogbu ọ bụrụ ma e tee ya n'ogogo buru ibu. N'ụfọdụ mba, mmadụ pụrụ ịzụta ha naanị mgbe ha natara nkwado dọkịta.
Ihe ndị ọzọ a na-etinye n'ude ndị ahụ bụ akụrụngwa ọjọọ dịka mercury na kojic acid.
Ọnọdụ ọjọọ ọ na-ebutere mmadụ gụnyere ụgwa, akpụkpa na ịgbanwe ka akpụkọahụ mmadụ si acha.



