You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Agụrụ, mmanụ ụgbọala, dọla na ụzọ ndị ọzo ọchịchị Tinubu n'otu afọ siri metụta ndị Naịjirịa
Ụmụafọ Naịjirịa akọwaala etu ha siri hụta ọchịchị Onyeisiala Bola Tinubu dịka ọ nọrọla otu afọ.
Nke a na-abịa dịka 29 Mee 2024 ga-eme ya otu afọ ọ weere ọkwa ọchịchị dịka onyeisiala Naịjirịa.
Otu nwokoroọbịa a kpọo Yusuf Suleimon bụ onye nkwado Tinubu kwuru na afọ ejughi ya n'ọchịchị Tinubu n'ime otu afọ.
Nwamadị a kọwara na ọ malitere mgbe ọ nọ n'ụlọakwụwkọ Sekọndịrị na-akwado Tinubu ruo mgbe ọ gụchara akwụkwọ ma tinyekwa ego ya iji nkwado ya n'oge ọ na-azọ ọkwa onyeisiala.
N'okwu ya "afọ ejughi m n'ọchịchị onyeisiala Tinubu n'otu afọ maka na ọtụtụ ihe ndị o kwere na nkwa, o mebeghi ha."
"O kwuru na ọ ga-ewepụta ọtụtụ ọrụ nye ndị ntoroọbịa mana a kwụsịrị m ọrụ n'afọ a, e nwekwara ọtụtụ ndị ntoroọbịa ọzọ na-enwezighi ọrụ ugbua."
Otu nwaanyị ọzọ kwukwara na oge ntuliaka na ọ kwadoro Tinubu mana ugbua na ihe isi ike akarịala ka ọ dịbu na mbụ.
Kirie ihe ha kwuru n'uju;