"Ọ bụ ihe ihere na ejichiri ụgbọelu atọ nke Naịjirịa n'ofesi" - Peter Obi

Ebe foto si, Bola Tinubu/Getty Images
Onye zọrọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa bụ Peter Obi akatọọla ihe ọkpọrọ "mmebọ n'ihu ụwa" mere mgbe ejichiri ụgbọelu atọ nke ala Naịjirịa.
Cheta na otu ụlọikpe nyere ụlọorụ mba Chaịna bụ Zhongshan Fucheng ikike ịnapụta Naịjirịa ego ruru $55m maka ikpe ịma ha.
Obi sị na o gosiri na ọdịda n'ọchịchị ala Naịjirịa nakwa nleda e nwere n'ebe iwu ikpe nọ n'ọchịchị onye kwuo uche ya.
"Rue mgbe otu ụlọikpe na Fransị nyere iwu machiri mburu na orure ụgbọelu atọ a, o nweghi kama otu ihe ụmụ Naịjirịa ma maka ya, e mere ya na nzuzo" ka o kwuru.
"A na m akpọ oku ka gọọmentị etiti pụta kwụwa aka ha ọtọ gbasara okwu a ma kọwaara Naịjirịa niile etu anyị siri rue ebe a" ka o kwuru.
Cheta na Gọọmentị eitit ekwuola na o nweghi ihe jikọrọ ha na ụlọọrụ Zhongshan Fucheng bụ nke kpụpụrụ ha ụlọikpe mere eji jichie ụgbọelu gọọmentị atọ.
N'ozi Bayo Onanuga bụ ọnụ na-ekwuru onyeisiala Tinubu weputara, ọ kọwara na okwu a malitere n'etiti ụlọorụ ahụ na gọọmentị Ogun steeti.
Onanuga kọwara na ụlọorụ ahụ na-achọ iji ụzọ ezighi ezi anapụ Naịjirịa ngwa ha nwere na mba ofesi.
Gọọmentị etiti ekwuola na ha ma maka okwu ahụ nakwa na ha ga-agbagha mkpebi ụlọikpe ahụ na mba Fransị nyere megide ha.
"O nweghi ihe jikọrọ gọọmentị etiti nakwa ụlọorụ ahụ. Okwu dị n'etiti Zhongshan na Ogun steeti bụ nke ụlọorụ ahụ chọrọ iji napụ anyị ngwa anyị na mba ofesi" ka ozi ya kwuru.
Etu okwu n'etiti Zhongshan na Ogun steeti si bido
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Dịka ụlọorụ onyeisiala si kọwaa okwu ahụ bidoro mgbe enyere ụlọorụ mba Chaịna ọrụ ngo ịrụ ebe akpọrọ Free trade zone n'afọ 2007.
Esemokwu banyere n'okwu ahụ n'afọ 2015 dịka ha malitekwara ịkpezi ya n'afọ 2016.
Mana n'afọ 2019, mkpebi enyere maka okwu ahụ mara gọọmentị Ogun steeti nakwa nke etiti Naịjitịa ikpe ma daa ha nha ego ruru $60m ebe ha gbaghara na-ekwu na naanị ihe ụlọorụ Zhongshan mere bụ ịrụ obere ọgba aja na gburu gburu free trade zone ahụ.
"Site na ndụmọdụ ndị ọkaiwu, gọọmentị Ogun steeti gbajọrọ mkpebi ahụ. Mgbajọ kwụụrụ ma nwee isi na mkpebi asatọ dị icheiche. E nwekwara mkpegharị ụfọdụ a na-eme na mba Briten nakwa Amerịka" ka ozi ahụ kwuru.
"Ogun steeti kpọkuru ụlọorụ Zhongshan ka amalute mkpezi nke nzụkọ ikpeazụ ha mere na London mba Briten n'afọ 2023.
Ndị gara ya bụ nzụkọ bụ Gọvanọ Dapo Abiodun nakwa Minister ikpe nkwụmọtọ bụ Lateef Fagbemi.
Na mbụ Zhongshan chọrọ ịnabata ya bụ mkpezi mana ha mechara tụgharịa azụ sị na ha chọrọ ụgwọ ha n'uju.
Nke a butere mgbasa nzụkọ ahụ dịka ehibere nzụkọ ọzọ na mbido afọ 2024.
Kemgbe ahụ, Zhongshan gbapụrụ ọsọ na-agba akụwkwọ dị icheiche iji napụ Naịjirịa ego ha nke otu ndị ọkaiwu Naịjirịa kpokọrọ ma okwu amaghị anya ya maọbụ kwado.
"Ogun steeti ka dị njikere ịchọ ụzọ a ga-esi kepzie okwu a dịka ha zigaara Zhongshan edemede n'izụka gara aga mana ha azaghị rue mgbe ha natara mkpebi adịgboroja a" ka ụlọorụ onyeisiala kọwara.
Ihe gọọmentị Ogun steeti kwuru maka ihe mkpebi a

Ebe foto si, Dabiodun/X
Gọọmentị Ogun steei etinyela ọnụ n'okwu njichi ụgbọelu atọ nke ụlọorụ onyeisiala dịka ngwa nke ụlọorụ mba Chaịna chọrọ ịnapụ Naịjirịa iji mezu ụgwọ ha ji ha.
Kayode Akinmade bụ onye ndụmọdụ Gọvanọ n'ozi o weputara kwuru na ha anụla maka mkpebi abụọ e mere megide ha n'ụbọchị 7 March 2024 nakwa Ọgọst 12 2024 bụ mkpebi nke Zhongshan nwetara n'agwaghị gọọmentị etiti maọbụ izi ha ozi.
"Nke a bụ ọzọ n'ime nchọnchọ ha na-anwa ịtinyekọ ngwa Naịjirịa nwere n'ofesi n'ikpe a na-ekpe nke otu n'ime ya enwebeghi isi rue ugbua" ka ozi ahụ kwuru.









