Mmerụahụ, ọnwụ nne na nna nakwa ọnọdụ mmekpaahụ: Etu ndụ ndị mmadụ si gbanwee kamgbe 7 Ọktoba 2023

Foto na-egosi Abdullah, Batsheva Yahalomi, Abdulrahman Al Ashqar na Christina Assi
Nkọwa foto, Site aka ekpe gawa aka nri: Abdullah, Batsheva Yahalomi, Abdulrahman Al Ashqar and Christina Assi
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 6

Batsheva amaghị ma di ya ndị Hamas kpụrụla ọ ka dị ndụ ma ọ nwụrụ anwụ, nne na nna Abdullah na-etoru ntoroọbịa a nwụọla ebe Christina na Abdulrahman nwere olileanya iji ụkwụ ha gaa ije ọzọ.

Ha si Izrel, Gaza, Lebanon na West Bank, na-agwa BBC etu ndụ ha gbanwere kamgbe mwakpo Ọktoba 7 (2023).

Ọ bụrụla otu afọ kamgbe ndị mwakpo Hamas zọbanyere n'ime Izrel, ma gbuoihe dịka mmadụ 1,200 ma tọrọkwa mmadụ 251.

Site n'aka mmegwa, Izrel cherela ndị Hamas aka mgba site n'ịgbawa ha ngwa agha dị icheiche n'ikuku ma n'ala Gaza, nke butere ọnwụ ihe karịrị mmadụ 41,000 dịka ndị ụlọọrụ mịnịstrị ahụike na Hamas health si wee kwuo.

‘Ihe mwute karịrị bụ ibiri n'ọnọdụ na-amaghị’

Foto Ohad na Batsheva na ụmụ ha, Yael na Eitan

Ebe foto si, Batsheva Yahalomi

Nkọwa foto, Foto Ohad na Batsheva na ụmụ ha, Yael na Eitan

N'ụbọchị bịara tupu ụbọchị 7 Ọktoba, Ohad Yahalomi na nwa ha nwaanyị dị afọ 10, Yael, gawara ịchọ anụmanụ n'ọhịa dị nso ebe ha bi. Ọkpara nne ya bụ Eitan, dị afọ 12, na ndị enyi ya na-agba egwuregwu bọọlụ. Nwunye Ohad, Batsheva na nwa ha nke obere, na-agbabeghị afọ abụọ dị n'ụlọ.

Ụdị ndụ a ka ndị obodo Nir Oz kibbutz - obodo na-enwekarịghị mmadụ 400 na ndịda Izrel, nke bụ otu maịlụ site na mba dị n'oke Gaza.

“Anyị hụrụ ihe ụmụ ụwa n'anya ebe ahụ mana anya anyị asapeghị ọfụma. Ọ dịka ebe obi aṅụrị,” Batsheva dị afọ 45.

N'ụtụ na-eso ụtụtụ ụbọchị 7 Ọktoba, ezinaụlọ a tetere ụra na-anụ ụda egbe na ogbunigwe si elu ada bụ ndụmọdụ na mwakpo Gaza di nso.

Na nkeji na-eso, ka a hụrụ ihe ndị a abụghị sọọsọ ụda egbe - ndị na-eti mkpu “Allahu Akbar” makwa ụda egbe si ilo na-ada.

Ka oge na-aga, ezinaụlọ a wee na-eche ebe ha zoro. Mana dịka ndị ojiegbe gbara ụlọ ha okirikiri na-eche ịwakpo, Ohad chere na o kwesịrị ịpụ n'ụlọ ahụ dịka mbọ ọ pụrụ ịgba ịkwụsị ndị mwakpo ahụ ịbata n'ezinaụlọ ha.

"Ọ gwara anyị kwa nkeji kwa nkeji na ya hụrụ anyị n'anya," ka Batsheva kwuru. O degaara ndị enyi ya: "Nkeji ikpeazụ anyị."

Ohad na ụmụ ya bụ Yael na Eitan nọ n'ime obu ibu tinyere nkịta ha

Ebe foto si, Batsheva Yahalomi

Nkọwa foto, Batsheva na di ya kwagara Nir Oz kibbutz afọ 12 gara aga maka inweta ezi ndụ
Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

N'ihi na ha ji egbe Kalashnikov na nchemgbọ, ndị mwakpo ahụ tiwara ụlọ anyị ma gbaa Ohad egbe, tupu ha achọpụta ma banye n'ụlọ nchekwa."Ha tụwara anyị egbe ha ma sụọ n'olu Bekee 'bịa na Gaza'. Aghọtara m ihe ha chọrọ ozugbo," ka o chetara.

E tinyere Batsheva na ụmụ ya ndị nke nwaanyị n'otu ọgbaatumtum ma tinyekwa Eitan na nke ọzọ, tinyere onye ọrụ si mba ọzọ, ma chewe ihu na Gaza. Batsheva na ụmụ ya ndị nwaanyị gbara mbọ rie mbọmbọ oge ọgbaatumtum ha tọrọ. Mana Eitan na nna ya ka adọkpụụrụ.

Ndị Hamas jichiri Eitan na Gaza mkpụrụ ụbọchị iri ise na abụọ (52). Batsheva kwuru na ndị Hamas manyere ya ikiri ihe onyonyoo esetere n'abalị 7 Ọktoba. "Ọ hụrụ etu ha siri gbuo ndị mmadụ na ụmụaka a mụrụ ọhụrụ na ụmụnwaanyị," ka o kwuru. A tọhapụrụ Eitan n'ọnwa Nọvemba naanị n'oge e nwere nkwekọrịta ịtọhapụ ndị e ji eji n'oge ọgbaaghara ahụ.

Ngalaba otu ndị Palestine bu ngwaọgụ wepụtara onyonyoo Ohad n'ọnwa Jenụwarị, ebe ọ dị ndụ mana ọ merụrụ ahụ. Ha anọrọla kemgbe kwuo na e gburu ya oge a tụrụ ogbuniigwe n'Izrel. Ndịagha Izrel agwala Batsheva na ha enweghị ike ịchọpụtanwu ma nke ahụ ọ bụ eziokwu maọbụ kwuo okwu gbasara ọnọdụ Ohad.

Nir Oz bụ otu n'ime obodo a kpara aka ọjọọ n'abalị 7 Ọktoba. A tọọrọ ọtụtụ ndị bi ebe ahụ. A ka gbahapụrụ ya, ụlọ ndị agbara ọkụ na-echeta ihe merenụ.

Batsheva kwuru na ụmụaka na-arọ nrọ njọọ dịka ọ bụ ha na ya edina n'otu akwa kemgbe ihe ruru otu afọ. Ha na-ajụ oge niile mgbe nna ha ga-alọghachi. Ntutu Eitan na-adasịsị.

"Nke kachasị njọ bụ amaghị ihe ọ [Ohad] na-agabiga - ma ọ dị ndụ ma ọ bụ na ọ dịghị. Anyị enweghị ike ịga n'ihu na-ebi ndụ anyị."

'Ọ gaara mma ọ bụrụ na e gburu m egbu'

Abdullah na-egosi mmerụahụ dị ya n'aka
Nkọwa foto, Abdullah nwetara mmerụahụ n'aka, afọ na ihu ya

Abdullah gbara ihe dịka afọ 13 oge Hamas mere mwakpo n'Izrel n'abalị 7 Ọktoba. Tupu oge ahụ, ndụ ya n'obodo al-Tawam dị na mgbago ugwu Gaza bụ nke ihe mejupụtara ya bụ agụmaakwụkwọ, ya na ndị enyi ya na-agba bọọlụ, ịga njem n'egberemmiri nakwa inwe obi aṅụrị ya na ndị mụrụ ya, nwanne ya nwoke na ụmụnnw ya ndị nwaanyị abụọ.

Ụbọchị bọrọ ụbọchị ncheta ọmụmụ ya, mpempe akwụkwọ fesara na mpaghara ha, nye iwu ka ndị niile bi ebe ahụ gbagaa na ndịda.

Ezinaụlọ ahụ mere ngwangwa kwakọọ ihe ndị bara oke uru ma gawa Salah al-Din Road, bụ ebe ndịagha Izrel wepụtara i si kpọpụ ha na-enweghị nsogbu.

Mana dịka ha n'okporoụzọ ahụ, mgbọ ndịagha Izrel e si n'elu tụta ụgbọala ha.

"A tụnyere mụ na nwanne m nwoke bụ Ahmad n'ikuku, site n'ụgbọala," ka Abdullah chetara.

Ahmad gbara afọ 16 n'oge ahụ. E gbupụrụ ya otu ụkwụ, e ji osisi igwe jigide nke ọzọ.

Shrapnel gbajibara Abdullah n'aka, isi, azụ na ọnụ. O kuliri uwe ya iji kpuhee ogologo ọnya abụọ dị n'afọ ya.

Ozu nna, nne na nwanne nna ndị a kpọrọ ọkụ ma gbarie bụ ndị a hụrụ ka e mesịrị, ka ndị ikwu ha gwara BBC.

Minna (aka ekpe), Hala (etiti) na Abdullah (aka nri) nọ n'egberemmiri dị na Gaza
Nkọwa foto, Abdullah na ụmụnne ya ndị nwaanyị, Minna (aka ekpe) na Hala (etiti) na mama nnukwu ha bi ugbua

'Amaghị m etu o si eme m n'ahụ ịchọpụta na m nweziri naanị otu ụkwụ’

Christina Assi n'ime ụlọogwụ

Ebe foto si, Handout

"A naara m akọwa onwe m dịka onye ntaakụkọ ihe onyonyoo. Taa a na m ekwu na m bụ onye gbalahụrụ mpụ agha," ka Christina Assi kwuru.

O weere ohere ahụ iji laghachi obodo ya bụ Lebanọn iji sete agha na-aga n'ihu na mpaghara ndịda ya maka ụlọmgbasaozi AFP.

Oge agha malitere n'abalị 7 nke ọnwa Ọktoba, ndị agha Lebanọn bụ Hezbollah malitere ịgba Izrel ogbuniigwe rọket nke mere ka ha malite ịkwakọrịta onwe ha mgbọ.

Christina na igwe onyonyoo ya tupu awakpoo ya

Ebe foto si, Handout

Ka ọ gasịrị mkpụrụ ụbọchị iri na abụọ, Christina e teta n'ụlọogwụ. "Amaghị m etu o si eme m n'ahụ ịchọpụta na m nweziri naanị otu ụkwụ na-abụghị abụọ."

Mwakpo ahụ tara isi onye ntaakụkọ Reuters bụ Issam Abdallah gbara afọ iri atọ na asaa (37), ma merụọ mmadụ isii ndị ọzọ ahụ.

Ugbua dịka ọ gasịrị otu afọ, Christina ka na-agba mbọ ịnabata ọnọdụ ọhụrụ ya.

O kwuru na ya na-ewe iwe ma na-enwekwa ọnụma n'ihi ihe mere ya.

Christina ka na-anata ọgwụgwọ mana o nweghị ike ịga ije.

'Amalitere m iti mkpu mana o megharịghị ahụ'

Abdulrahman nọ n'ụlọogwụ dịka e bepụrụ ya ụkwụ abụọ ruo n'ikpere

Ebe foto si, Family photo

Nkọwa foto, Abdulrahman nọ n'ụlọogwụ kemgbe a tụrụ ogbuniigwe n'ụbọchị 1 Septemba

It was evening. Abdulrahman Al Ashqar says he and his friend, Laith Shawahneh, were walking down the street, smoking cigarettes after a day spent selling corn.

Ọ bụ n'oge abalị. Abdulrahman Al Ashqar sị ya na enyi ya bụ Laith Shawahneh na-agbadata n'ogbe ma na-ese sịga.

"N'otu ntabianya, ha atụọ anyị ogbuniigwe, ọ gwụla," ka Abdulrahman gbara afọ iri na asatọ (18) chetara ihe mere ya n'abalị 1 Septemba.

Ogbuniigwe ndị agha elu Izrel tụtara ụmụaka ndị na-eto na-eto n'obodo Silat al-Harithiya dị na West Bank ndị Izrel weghaara.

Abdulrahman chetara na ya nụrụ ụda ogbuniigwe rọket mana o nweghị oge izere isi ya. "Agbara m mbọ zọọ naanị otu njem," ka o kwuru. "Amalitere m itiku Laith mkpu mana o megharịghị ahụ."

E gburu Laith gbara afọ iri na isii (16) ebe Abdulrahman nwetara nnukwu mmerụahụ dịka e bepụrụ ya ụkwụ abụọ ruo n'ikpere.

Abdullah ka nwanne ya nwoke na-ebugharị ya n'igwe ndị ngwọrọ

Ebe foto si, Family photo

Nkọwa foto, Abdulrahman chọrọ enyemaaka nwanne ya nwoke ugbua maka ihe ndị ọ kwesịrị ime kwa ụbọchị