'Eze Crypto riri m nde dọlla 2.1'

Sunil Kavuri

Dịka a na-akwado ikpe "Eze Crypto" ikpe nrụrụaka dị icheiche, otu nwoke mba Briten akọọla etu ọdịada ụlọorụ Sam Bankman-Fried si napụ ya nnukwu ego nke ọ na-enwe olileanya ịnweghachite ma nke ya ma nke ndị ọzọ dị ka na mba ụwa niile.

Rue mgbe ọ dara, Sunil Kavuri na-enwe olileanya na Sam Bankman-Fried ga-atụgharị ọnọdụ dị ya.

Eze ala ukwu Crypto na-ada mana dịka ndị ọzọ na-agbagharị, Sunil jidesie onwe ya ike.

Ahụmihe ya n'ịzụrụ ndị ụlọakụ ego nakwa itinye ego ya na Crypto akụzierela ya ijide obi ma kepu kepu na-efegharị.

Gụnyere na Bankman-Fried na onwe ya - si na ọ bụ onye nzọpụta crypto- na-agwa ndị mmadụ na ihe niile dị mma.

Mana ozi nọkatara bata n'ekwentị - akwụsịla ndọpụ ego.

FTX - bụbụ mgbanwe crypto nke abụọ kachasị n'ụwa niile dara kụọ afọ n'ala.

N'anya Sunil, mbọ niile ọ gbara n'afọ ole ma ole gara aga alaala n'iyi.

Ego ya nde $2.1 efuola.

"A nọrọ m n'igwe Kọmpụta ihe ruru otu abalị, na-atụgharị peeji ahụ ma na-anwa izigara ndị FTX ozi ịnweta ego m, ahụ rịara m. Uche m bụ " O chi m o, ọ gwụla. Ihe niile efuola m" ka o kwuru.

Maazị Kavuri bi na Derbyshire mba Briten na-edokọ bu ego iji zụta ụlọ ọhụrụ ma ziga nwa ya mahadum mana ugbua, dịka otu afọ gachara, naanị ihe o ji aka bụ akaebe ihe bụbu nke ya.

FTX Logo

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, FTX bụ ụzọ mgbanwe ego crypto a na-ekwu bu ụzọ onye ọbụla chọrọ ịbanye ụwa crypto ga-esinwu

E cheere na ọ bụ ya ka ọdịda ụlọorụ FTX metụtara na mba Briten niile.

Mana e nwere ndị dị ka Sunil na mba ụwa niile nke mere na ọ ghọrọla 'onye na-azọ ikike ruru ndị FTX metụtara' ebe ọ na-enye ndị mmadụ aka ịgba akwụkwọ ịweghachite ego ha.

"Otu onye na mba Turkey nwere naanị $600 n'obego ya dịka ihe niile funariri ya ebe onye ọzọ gara ụlọọgwụ dịka ezigbo ụjọ jidere ya" ka ọ na-echeta.

Sunil na-enyere ndị mmadụ na US, Canada, Argentina, Duabi, Turkey, Hong Kong, Chaina na Singapore aka.

Ọtụtụ ndị mmadụ funariri ọtụtụ narị dọlla, ụfodụ funariri puku kwuru puku dọlla mana otu onye fụnarịrị nde kwuru nde dịka ya.

Ha niile ga na-ele ikpe ahụ ma ọ malite n'izuụka na-abịa.

Sam Bankman-Fried
Nkọwa foto, Sam Bankman-Fried, bụ onye malitere ụlọọrụ crypto dara ada bụ FTX
Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Ndị na-ekpe ikpe na mba Amerịka boro Sam Bankman Fried ebubo nrụrụaka, ịkpa nkata nakwa izupu ego ruru asaa.

Nwa amadi a dị afọ iri atọ na otu bụ onye mepere ụlọorụ FTX nakwa ọzọ bụ Alameda Rsearch agbaghaala ebubo ndị a nakwa ọ ga-esi n'ụlọ mkpọrọ ga zara ọnụ ya n'ụlọikpe.

Ndị ọzọ rụụrụ ya ọrụ ekwetala na ikpe mara ha dịka a na-atụ anya ha ga-enweta ihe akaebe igosi etu ụlọọrụ ha nweburu ijeri $40 si daa.

FTX bụ mgbanwe crypto a na-ere dịka ụzọ dị mma onye ọbụla chọrọ ị banye crypto ga-esinwu. 

Ụlọọrụ ahụ na-arụ ka ụlọakụ na-enye ndị mmadụ ohere ire, ịzụ nakwa ịchekwa ego na crypto ha. 

Ha nwetara ihe ruru mmadụ nde itoolu na mba otu narị. 

Mgbe ha dara ihe karịrị mmadụ otu nde bụ ndị ego ha funariri n'ihi enweghị ike gbapụta ego ha n'oge.

Ebubo nke kachasị e oro Bankman-Fried bụ na o ji aghụghọ napụta ndị mmadụ ego site n'iji ego ha akwalite atụmatụ adigboroja n'ụlọọrụ nke ya. 

Ọ merụrụ nde kwuru nde n'ịzụ akụnụba dara oke ọnụ nakwa inye ndị ndọrọndọrọ ọchịchị onyinye. 

Bankman-Fried ekwubuola na "E zughi m ego ndị mmadụ, ezopughi m ijeri kwuru ijeri ebe ọbụla" 

Mkpughe ya malitere mgbe ụlọ ntaakụkọ Coindesk mechara nyocha banyere etu ya na ego si aga n'ụlọọrụ Alameda na FTX. 

Tupu a nwuchie ya na Bahamas, o kwuru na ụfọdụ mkparitauka gụnyere nke BBC na o chegharịala na mmehie ego niile o mere mana o kuwsiri ike na ọ maghị ụma me ya. 

"Sam Bankman-Fried emebiela ndụ ọtụtụ mmadụ" ka Kavuri kwuru. 

Sunil takwara ndị nyere Bankman-Fried aka wulite ụlọọrụ ya ụta. Ya bụ ndị a ma ama nakwa ndị na-ere ahịa gosiri ya dịka onye e nwereike ịtụkwasi obi. 

N'oge ha kacha ewu ewu, ha mere ngosi na Super Bowl na mba Amerịka nke onye okpa ọchị Larry David nọ na ya na-agwa ndị mmadụ "ekwela ka nke a gafee gị".

Larry David FTX advert
Nkọwa foto, Ọkpa ọchị Larry David so n'ime otu ngosi FTX

Sunil agbaala akwụkwọ abụọ n'ime imeke ikpe na-aga n'ihu megide ndị ji ịntanetị ere ahịa nakwa ndị a ma ama.

E cheere na ngụkọ na nhazi ego FTX ga-ewe ụfọdụ afọ dịka ndi ọkaiwu na-achọ ụzọ niile ha ga-esi weghachite ego.

N'izuụka gara aga, a gbakwara nne na nna Bankman-Fried akwụwkwọ maka ego ha natara nwa ha nwoke site n'ego nkitị nakwa ụlọ dị oke ọnụ na Bahamas.

Kavuri sị na okwukwe o nwere FTX wulitere elu mgbe ụlọorụ na-ebinye ego a ma ama ji ezigbo ego akwalite mgbanwe crypto. Sequoia Capital ji ihe ruru nde $213 iji kwado ụlọorụ ahụ bụ nke o deriri ugbua dịka ego furu efu.

"A hụrụ m na ọtụtụ otu na-akwado FTX nke mere m ka m chee na 'hmmm ọ dịkwa ka ebe a a bụ nke ziri ezi'", ka o kwuru.

Sunil Kavuri
Nkọwa foto, Sunil Kavuri nọzị n'ọnọdụ amaghị ama tere aka dịka ọ na-achọ ịweghachite ego nnukwu funarịrị ya

N'ụbọchị Tọzde, nwunye Sunil mụrụ nwa nke abụọ ha nke kpalitere mmụọ ya ịweghachite ụfodụ ego funarịrị ya.

Ugbua ha na-eche ma na-enwe olileanya.

Ndị ọkaiwu Sam Bankman-Fried kwuru na ha enweghi okwu gbasara akụkọ a.