Ọ bụ eziokwu na ndị ojiegbe wakporo ụlọakwụkwọ Oko Polytechnic dị n'Anambra?

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Ihe ọdachi mere n'ụlọakwụkwọ nkanụụzụ Federal Polytechnic Oko dị n'okpuru ọchịchị Orumba Nọ n'Anambra steeti.

Akụkọ e nyochaghị enyocha kwuru na ndị ojiegbe wakporo ụlọakwụkwọ ahụ n'abalị Tọzde 19 Juun 2025, gbuo ụfọdụ mmadụ, merụọ ụfọdụ ahụ ma tọrọkwa ndị ọzọ.

Ozi ahụ kwuru na ha bụ ndị ojiegbe wakporo oge a na-atụghị anya, ma kwaa ụmụakwụkwọ, ndị nkụzi na ndị ọrụ nke ụlọakwụkwọ ahụ mgbọ.

Dịka akụkọ ahụ anyị nwetara siri kwuo, a sị na a gbara ụmụakwụkwọ karịrị asaa egbe, dịka anọ n'ime ha nwụrụ.

Akụkọ ahụ kwukwara na a gbagburu otu onye nkụzi na mmadụ abụọ ndị ọzọ oge e mere mwakpo ahụ.

Ya bụ akụkọ gara n'ihu kwuo na ndị ojiegbe ahụ amaghị ndị ha bụ tọọrọ ụfọdụ ndị nkụzi rie mbọmbọ.

Ihe ndị uweojii kwuru maka mwakpo ndị ojiegbe mere n'ụlọakwụkwọ Oko Polytechnic

Ndị uweojii akọwaala mwakpo e mere n'ụlọakwụkwọ nkanụụzụ Federal Polytechnic Oko dị n'Anambra steeti dịka ihe mere eme.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Anambra steeti bụ Tochukwu Ikenga mere ka anyị mata nke a n'ozi o wepụtara n'ụbọchị Fraịde 20 Juun 2025.

Ikenga gwara anyị na ndị uweojii na ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ gụnyere ndịagha, ndịagha mmiri, ndị Civil Defence na ndị nche obodo ewegharala ebe ahụ ya bụ mkpamkpa kpara.

Ozi ahụ kwuru na ya bụ ọnọdụ bụ nke a na-enyo enyo na ọ bụ esemokwu ndị otu nzuzo, bụ nke mere ha jiri kwakọrịta onwe ha mgbọ mgbe ọ fọdụrụ nkeji iri abụọ ka ọ kụọ elekere itoolu nke abalị n'ụbọchị Tọzde 19 Juun 2025.

Ha kwuru na ebe a kwara mgbọ ahụ bụ na Total Junction nakwa Tipper Junction dịcha n'Oko n'okpuru ọchịchị Orumba North nke Anambra steeti.

Ozi ahụ Ikenga wepụtara kwuru na ndị uweojii napụtara mmadụ abụọ gụnyere otu nwaanyị na-anara ọgwụgwọ n'ụlọọgwụ ugbua.

Ndị uweojii kwuru na mmadụ abụọ nwụrụ n'oge e mere ya bụ mwakpo, dịka a na-ebo ebubo na ndị ojiegbe ahụ tọọrọ mmadụ abụọ rie mbọmbọ.

Dịka ndị uweojii siri kwuo, ndị jiiri anya ha hụ ka mwakpo ahụ siri mee kwuru na ndị omekome kpara arụ ahụ ji ọgbaatumtum na ụgbọala Lexus 350 na-enweghị akara.

Ka o sina dị, ụlọọrụ ndị uweojii Anambra steeti kpọrọ oku ka onye niile dere duu dịka ha ji ihe akaebe niile ha nwetara ebe ahụ ndị omekome wakporo eme nnyocha ugbua iji chọpụta ma nwụchie ndị aka ha dị na ya.