Etu sịga onye ọzọ sere si ebutere gị ọtụtụ ọrịa
Ọtụtụ nnyocha sayensị egosila etu ise sịga si akpatara mmadụ ọtụtụ ọrịa ọjọọ, nke gụnyere kansa ọjọọ dị iche iche.
Mana nnyocha egosikwala na sịga ndị esere tụpụ n'iro, so na ihe kacha agbarụ mmiri n'ihi na ọtụtụ kemịkalụ ọjọọ na-esi n'ime ya apụta na-abanye n'osimiri.
Nnyocha gosiri na ọnụọgụgụ ike sịga (cigarette filter) ndị mmadụ na-atụfu atụfu karịrị tarị anọ na ụma ise (4.5 trillion) kwa afọ.

Ndị ọkachamara sayensị na-ekwukwa na ihe e ji emepụta ike sịga bụ akụrụngwa a kpọrọ 'cellulose acetate', nke bụ ụdị plastik nwere ọtụtụ kemịkal n'ime ya.
Ọ bụrụ na mmadụ sechaa sịga ma tụpụ ike ya n'ezi, mmiri maa ya, kemịkal ọjọọ ndị a ga-esi n'ime ya pụta, ọtụtụ ga-abanye na mmiri mmadụ na-aṅụ maọbụ nri mmadụ na-eri.
Ajọ kemịkal ndị a na-ebute ọrịa dị icheiche dịka kansa ara, kansa ngụgụ, kansa 'prostates', dgz.
Ụzọ ka mma isi tufuo ike sịga
Joseph Aston bụ ọkammụta n'ọrịa kansa kwuru na mkparịtaụka ya na BBC sị: "Onweghị ụzọ ka mma kpamkpam iji tụfuo sịga e sere ese, maka na ha dị njọ n’ahụ mmadụ, ihe ọbụla ọ sọrọ gị mee ha.
"Mana ndụmọdụ ka mma bụ, biko, atụsala ya etu ọbụla dị gị mma.
Tụnye ha n’ime ebe e wepụtara maka ịtụnye ike sịga."
Kiri onyoonyoo dị n'elu ka ị ghọta nke a n'uju.










