Zama Zama South Africa: Ihe na-eme n'ime ọnụ ebe a na-egwupute ọlaedo
Ngalaba Africa Eye nke BBC emeela nchọpụta banyere ndị mbịarambịara na-eso egwupute ọlaedo na mba Saụt Afrịka.
N'ihe onyonyo ha wepụtara, ụfọdụ ndị ahụ na-egwu ala n'ihe a kpọrọ 'Zama Zama', kọwara ihe ize ndụ ha na-agabiga igwupute ya bụ ọlaedo.
Ha kwuru na ụfọdụ oge ndị omekome na-awakpo ha n'ime ala ebe ahụ.
Ha kwukwara na ụfọdụ oge ndị uweojii na-anwụchi ha, ebe ụfọdụ na-ezute ọnwụ ha n'ime ọnụ ahụ.
Ndị nwunye ha kọwara etu ụjọ na-esi ejide ha ma di ha zọpụ ije a, ma kwuo na ọ bụ eziokwu na a na-asị ha ṅụọ 'milk' iji nyere ha aka ma ụzụzụ si n'igweri ọlaedo a nye ha nsogbu, mana ọtụtụ oge ka ọ na-ara ha ahụ inweta ego ha ga-eji zụọ ya bụ 'milk'.
Lee ihe ha kwuru n'uju ebe a: