Heavy Rainfall: Etu oke ifufe si gbuo otu onye ma laa ngwo ngwo n'iyi n'obodo Isiagu, Ezema Olo, Enugwu Steeti
Oke ikuku so mmiri akwatuola ụlọ dagburu otu nwoke a ma merụọ otu onye ọzọ ahụ n'ụbọchị Mọnde 25 Eprel, 2022 n'obodo Isiagu, Ezema Olo nke dị n'Enugwu Steeti.
Otu nwokoroọbịa aha ya bụ Obichukwu Chukwu gwaraa BBC Igbo etu oke ifufe a kwatuo ụlọ a na-azụ ọkụkọ merụọ ya ahụ ma gbuo nwoke ahụ.
O sị ihe mberede a gbajịrị ya ọkpụkpụ ụkwụ mgbe ụlọ ahụ dakwasịrị ya na nwoke ahụ n'elekere anọ nke mgbede ruo elekere itoolu nke abalị mgbe ụmụnne ya bịara zọpụta ya.
Chukwu onye na-anata ọgwụgwọ n'ụlọọgwụ kwuru "Etigidere m mkpu ruo mgbe ike gwụrụ m. Tupu ụmụnne m abịa, a kwụsịla m ịnụ olu nwoke a, oge ahụ ka m malitere chewe na ọ laala mmụọ".

Onye nwe ụlọọrụ ahụ bụ Ephraim Chukwu kwara arịrị maka ihe ọdachi a gburu nwoke a ma kwuo na e liela ya n'ụbọchị Tuzde.

O kwuru na ihe a gbawara ya obi ma sị na ụmụ ọkụkọ ya ndị ihe a metụtara abụghị ihe na-eche ya uche.
Epraim sị na ya na nwoke a nwụrụ anwụ nwere ụmụ ise arụkọọla ọrụ ihe ruru afọ atọ.

Oke ifufe a metụtara akụkụ obodo ahụ n'ụzọ ndị ọzọ dịka ọ kụtụrụ ụlọakwụkwọ ọta akara Holy Kids Nursery nakwa ebe ndị ọzọ.
Nwoke ọzọ bụ onye obodo ahụ a kpọrọ Emeka Chiekwe kwuru na ya bụ mmiri kupuru gbam gbam ụlọ ahụ nakwa ụlọ ndị agbataobi ya ndị ọzọ, dịka o kwuru na ihe a mere wutere ha nke ọma.
