Kenya Water Crisis: Etu e si were teknuzu na-ebuso nsogbu enweghị mmiri agha na mba ahụ
Mmiri bụ otu n’ime ihe mmadụ niile n’ụwa na-eji ebi ndụ mana ọtụtụ ebe na-enwe nsogbu enweghị mmịrị nke mere ihe ji esiri ndị bi ebe ndị ahụ ike.
Nsogbu enweghị mmiri na-ebute oke ahụhụ, ọrịa nakwa na-emetụta akụnụba na ndụ ndị bi na mpaghara ụkọ ya na-adị.
Mpụtara nnyocha gosiri na ihe kariri okara ndị bi n’ụwa ga-enwe ụkọ mmiri n’afọ 2050 ọkachasị dịka mgbanwe ihu eligwe na-emetụta ụkọ mmiri n’ụwa.
Otu n’ime mba ndị na-enwe nsogbu mmiri dị ọcha n’Afrịka bụ mba Kenya ọkachasị obodo Mombasa nọkwa nso oke osimiri ‘Indian Ocean’.
Obodo a so na obodo ndị na-enweghị ka ọ hara ha na mba ahụ dịka ndị bi ebe ahụ enweghị ike maọbụ ego e ji gwupee mmiri ala.
Gịnị bụ Desalination?
Iji nyere ndị obodo a aka, ụlọọrụ ‘Givewater’ ji usoro teknuzu a na-akpọ ‘Desalination’ bụ usoro iwepụ nnu dị na mmiri oke osimiri ma mee ka mmiri dị ọcha ma dịkwa mma maka ọṅụṅụ were na-emepụtara ndị bi ebe mmiri dị ọcha ha nwereike ịzụta ma nwere bie ndụ.
Mmepụta mmiri dị ọcha nke usoro a na-akwalite agbapụtala ụfọdụ ndị bi ebe ahụ n’aka ọrịa, ubịam nakwa oke ahụhụ.
Kirie ihe onyonyo a ka ịhụrụ etu ya bụ ihe si aga na mba Kenya.

