Etu ọkụ si gbaa ụlọ nchekwa ozu dị na General Hospital Onitsha
Ozu gbara ọkụ mgbe ụlọ nchekwa ozu nke General Hospital nke dị n’Ọnịcha gbaa ozu dọrọ ebe ahụ ọkụ gwogwo.
Onye akaebe kwuru na ọkụ si n’ọhịa banyere n’ụlọ nchekwa ozu n’ihe dịka elekere iri na abụọ nke ehihe.
Ozu ndị a gbara ọkụ nke ukwu nke bụ na ndị na-arụ ebe ahụ na ndị butere ozu ebe ahụ amaghịzị nke bụ nke.
Kama ndị na-arụ ebe ahụ siri na ọ bụ naanị ozu ndị omekome ka ha nwere ike ịkọwapụta maka na edowere ha iche.
Onye nọ ebe ahụ mgbe ọ mere sị na ajọ isi sitere n’ozu ndị agbara ọkụ na-esi n’ogige ụlọọgwu a nke mere na ọdịghị mma maka ahụike ndị ọrịa na ndị ọrụ.
Onye ntaakụkọ anyị hụtara na oteela aka asụrụ ọhịa nọ n’ogige ụlọ nchekwa ozu a.
Cheta na kemgbe ụgụrụ a na ọkụ ole ma ọle agbaala n'ala Igbo.
N'Ụmụahịa
N' Ụmụahịa, n'ụtụtụ Mọnde, ọkụ gbara otu ahịrị ụlọahịa ndị mmadụ nke otu ụka so n'ime ya.
Pastọ David Orji bụ onye nwe ụka ahụ sị na otu enyị ya kpọrọ ya n'ekwentị n'ime abalị 12:30 am gwa maka ya bụ ọkụ ọ sị malitere n'elekere 10:30 am abalị Sọnde.
Ndị ọzọ ya bụ ọkụ metutere sị na ha na-ekele Chukwu na ndị ọrụ gbatagbata mmenyụ ọkụ bịara n'oge.
"Ọ bụrụ na ndị ọrụ mgbanyụ ọkụ abịa n'oge, ya ọkụ kara ị ka njọ".
N'Awka
N'ọnwa Nọvemba 2021, dịka ndị Anambra na-akwado ntuliaka ndị gọvanọ, ọkụ gbara otu ọdọ mmanụ ụgbọala na Unizik Junction.
N'Onitsha
Ka nke ahụ mechere, ọnwa Disemba, ọkụ gbakwa ọdọ mmanụ ụgbọala n'Onitsha.
N'Oko
N'ọnwa Jenụwarị, ọkụ ọzọ gbara ahịa Eke Oko mebie ọtụtụ ihe ndị mmadụ ebe ahụ.
Ọtụtụ kwara arịri maka ya bụ ọkụ kpọjọrọ ha ihe afọ ọhụrụ.