You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Nonye Soludo's wife: Ọmalịcha nwaanyị na-ebu Chukwuma Soludo, gọvanọ ọhụrụ Anambra isi
Ọchịchị efela aka Charles Chukwuma Soludo dịka gọvanọ Anambra steeti dịka o meriri ntuliaka e mere n'ụbọchị isii nke ọnwa Nọvemba 2021.
Mana dịka ndị Bekee na-ekwu na nwoke ọbụla na-eme ọfụma nwere ọmalicha nwaanyị na-akwado ya.
Mmeri Chukwuma ji ọkọlọtọ pati All Progressives Grand Alliance (APGA) na ntuliaka ahụ, pụtara na nwunye ya bụ Nonye ga-ewere ọnọdụ dịka nwaanyị mbụ nke steeti ahụ, nke Bekee kpọrọ "first lady".
Onye bụ Nonye Soludo?
- A mụrụ ya na Julaị 31, 1970. Ọ dị afọ 51 ugbua
- Nonye bụ onye ji ego achụ ego gụrụ maka kọmputa na ihe gbasara akụnaụba ('Computer Science' nakwa 'Accounting and Finance') na mahadum Naịjiria dị na Nsukka na mahadum Westminister dị na mba Briten
- Site n'akara Instagram ya, o depụtara na ọ bụ onyeisi ụlọọrụ 'Royal Oats' ebe a na-emepụta nri 'oats'
- Ya na Chukwuma di ya na-akwado atụmatụ ahụike na mmeghari ahụ site n'ụlọọrụ "Healthy Living Foods" ha hibere
- O nwere ọba mgbasaozi maka ahụike nke ọ kpọrọ "Nonye healthy living" ebe o si enye ndị mmadụ ndụmọdụ nakwa ozi dị mkpa gbasara ahụike
- Nonye na di ya ji ụmụ isii (nwaanyị anọ na nwoke abụọ) ugbua
- Ọ gwara BBC na isi nri na-amasị ya
Ọrụ 'first lady' na-arụ
Ụfọdụ ọrụ eji mara ndị nwunye aka na-achi obodo gụnyere:
- Ilekọta di ha nọ n'ọchịchị anya na inye ha nkwado
- Ihibe, ikwado na ịchịkọta otu ụmụnwaanyị na ụmụaka, inyere ndị ogbenye aka nakwa ịlụrụ ndị na-enweghi ka ọ ha ha ọgụ ikike dịrị onye wdgz
- Ihazi emume dị iche iche a na-eme n'obi gọọmentị, wdgz.
N'agbanyeghị na akwụkwọ iwu Naịjirịa akwadoghị ụlọọrụ nwunye onyeisiala maọbụ nwunye Gọvanọ steeti ọbụla na Naịjirịa, ọ bụ nnukwu ọkwa nye ndị nwunye onye ọbụla na-achị tụmadị n'Anambra steeti.
Nwunye ndị ha na Chukwuma Soludo so zọọ ọkwa a
Andy Ubah, Valentine Ozigbo na Ifeanyi Ubah so na ndị ọzọ zọrọ ọkwa gọvanọ Anambra steeti a kacha kpụrụ n'ọnụ mgbe ahụ.
Lee ihe ị kwesịrị ịma maka ndị nwunye ha:
Uchenna Ubah
Uchenna bụ nwụnye Ifeanyi Ubah, onye na-azọ ọkwa gọvano n'okpuru Young Progressive Party (YPP).
Uchenna dị afo 48 ugbua dịka a mụrụ ya na Mee 13, 1973.
Ya na di ya ebiela dị ka di na nwunye ruo afọ 24.
Uchenna na-arụ n'ụlọọrụ 'Capital Oil and Gas Industries Limited' ebe a na-emepụta mmanụ agbidi, ọ gụrụ 'Business Administration' na mahadaum Ahmadu Bello nke dị na Zaria.
Ya na di ya ji ụmụ ise.
Mary-CallistaOjiugo Ozigbo
Ojiugo bụ nwunye Valentine Ozigbo bụ onye na-azọ ọkwa gọvanọ n'okpuru pati People's Democratic Party (PDP).
Ojiugo bụ onye na-enyere ndị mmadụ aka nke ọkankụ ha bụ ụmụakwụkwọ.
Ya na di ya na-enyerekwa ndị mmadụ aka site na ngalaba 'Valentine Chineto Ozigbo (VCO) Foundation' nke ha abụọ hibere.
Ha ji ụmụ anọ.
Nwunye Andy Uba
Andy Uba bụ onye ji ọkọlọtọ All Progressives Congress (APC) zọọ ọkwa gọvanọ Anambra steeti n'afọ 2021.
Ruo ugbua ọtụtụ mmadụ amaghị kpọkwem onye bụ nwunye Uba maka na anaghị ahụkarị ebe ha abụọ kwụ n'ọha.
Ndị bụbu 'first lady' Anambra steeti n'oge gara aga:
- Ebelechukwu Veronica Obiano: Nwunye Willie Mmaduaburochukwu Obiano na-achị Anambra steeti site n'afọ 2014 ruo ugbua
- Margaret Obi: Nwunye Peter Gregory Obi chịrị Anambra steeti site n'afọ 2007 ruo 2014
- Evelyn Ngige: Chris Nwabueze Ngige chịrị Anambra steeti site n'afọ 2003 ruo 2006
- Nnebuogo Mbadinuju: Chinwoke Mbadinuju chịrị Anambra steeti site n'afọ 1999 ruo 2003