Kabul Airport attack: Ndị agha mba Amerịka 12 nwụrụ na mwakpo a

    • Onye dere ya, Rhodri Davies and the BBC investigations team
    • Ndị mere akụkọ a, Illustrations by Elaine Jung

Akụkọ na-apụta n'ehihie ụbọchị Tozde na-ekwu na egbeigwe agbaala n'ọdọụgbọelu Kabul dị na mba Afghanistan.

Onye ntaakụkọ BBC kwuru na ogbunigwe ahụ gbara ugboro abụọ dịka ịkwa mgbọ so ya.

Akukọ kwuru na ihe ruru ndị agha mba Amerịka isir nwụrụ na ya bụ ọdachi.

Achọpụtakwara na ọ bụ mmadụ abụọ yinyere ogbunigwe n'ahụ ha kpara mkpa mkpa a.

Ihe ahụ gbara mere n'ebe akpọrọ 'Abbey gate' bụ ebe ọtụtụ ndị gbara ọsọ ndụ nọ na-eche nzọpụta.

Ugbua, mba Fransị ezipula ozi n'akara Twitter na-agwa ndị be ha nakwa ndị 'enyi' ha si na gburugburu geeti ahụ pụọ.

Eburukwara ndị merụrụ ahụ n'ihe ahụ gawa ụlọọgwụ iji zọ ndụ ha.

Mmadụ 20 anwụọla kamgbe sụnde gara aga n'ọdọ ụgbọelu dị n'Afghanistan

Otu onye ọrụ Nato gwara ndị ụlọ ntaakụkọ Reuters na opekete mpe mmadụ iri abụọ anwụọla n'ogige ọdọ ụgbọelu Kabul dị n'Afghanistan kamgbe ndị Taliban naara ọchịchị n'ụbọchị sụnde.

Onye oru Nato a kwuru sị, "Mkpamkpa na-akpa n'ogige ọdọ ụgbọleu Kabul dị nwute. ọrụ anyị ugbua bụ ịhụ na ndị ọbịa nọ na mba ahụ pụchara".

O kwukwara na ndị agha ha na-edopụị onwe ha iche iji kpchie ha na ndị Taliban ịtakọ isi.

Etu ndị mmadụ na-agba ọsọ ndụ si juputa n'Ọdọụgbọelu Kabul

Ụda egbe na-ada aghara aghara n'ụtụtụ a n'ọdọ ụgbọelụ Kabul dị n'Afghanistan dịka ndị mmadụ na-agba ọsọ ndụ igbalahụ ndị otu Taliban weghara ọchịchị n'Afghanistan.

Mana gọọmenti mba Amerịka ekwuola na ọ bụ ndị agha ha na-agbali egbe elu iji belata ọgbaghara igwe mmadụ butere n'ogbe ahụ.

A nụru ụda egbe n'onyonyo na-efegharị na soshal midia dịka ahụkwara ebe ndị mmadụ na-arịgharị n'akụkụ ụgbọelu.

Ndị agha US nọ n'ọdọụgbọelu Kabul ma jiri ụgbọelụ ndị agha na-ebupu ndị ọrụ ha na mba ahụ.

Ndị Afghan nọ n'aka ọchịchị ndị Taliban sị na ha enweghịzi nwereonwe

Na mbụ Nooria Haya bụ nwaanyị na-enyere ụmụnwaanyị na-amụ nwa aka na ụmụ nwoke dọkịnta na-enwe nzụkọ kwamgbe dịka oru ha siri dị.

Ọ bụ na nzụkọ a ka ha na-atule etu ha ga-esi arụ ọrụ ha.

Ha nọ n'obodo Ishkamish, dị na mpaghara Takhar dị n'oke ala jịkọrọ Afghanistan na Tajikistan.

Kama nwaada a dị afọ 29 achọpụtala na ha agaghịzịe nwe nzụkọ maka ndị Taliban ewebatala iwu ha.

Ishkamishsits sọ na otu n'ime obodo dị mkpa ndị agha Taliban wehachịrị dịka ndị agha NATO ruru 10,000 pụrụ n'ọnwa Mei.

Nke a butere agha n'etiti Taliban na ndị agha gọọementị bụ ndị dịka ha akwadoghị akwado dịka ndị agha Taliban napụrụ ha mpaghara Burka.

Ndị bị na mpaghara Kandahar matakwara na ndị agha Taliban na-enwe mmerị ozugbo ozugbo ndị agha mba Amerịka hapụrụ ọdọ ụgbọelu dị na Kandahar.

Ndị mmadụ gbachidere onwe ha n'ụlọ ha. Ndị Taliban enwerela ọnọdụ n'ọtụtụ obodo. Ndị obodo enweghịzị ebe ha ga-agbaga ugbua.

Ndị agha bu egbe na-agagharị n'okporo ụzọ niile, ma n'ụtụtụ ma na mgbede.

Ha na-akụ aka n'ụzọ ndị mmadụ ana ha nrị, ọtụtụ ji ụjọ enye ha ihe ha chọrọ.

Jan bụ onye na-ere mkpụrụ osisi kwuru sị, " Ezinụlo ọbụla na-edowere ha achịchị atọ maọbụ anọ".

Ndị agha a chọkwaa ịnọ n'ụlọ gị ha ga-anọ ebe ọ masịrị ha.

Ndị Taliban n'ọnwa Juun kwuru na ha ewerela mpaghara Takhar, Faryab na Badakhshan. Nke a mere ka ndị agha Afghanistan lahachi azụ.

Ndị agha mba Amerịka ruru puku abụọ na narị ise apụọla tupu Taliban ewere mpaghara ndị a.

Ọtụtụ ndị Afghan na-ekwu na etu ndị agha Amerịka siri pụo adịghị mma, ha kwuru na ha pụrụ ọsịsị.

Ha na-ekwu kwa na mkparịta ụka ndị Amerịka na Taliban nke ruru afọ abụọ nyere Taliban ohere ịkpọta ndị agha ọzọ ma nye ha ohere ibawanye.

Dịka ndị Taliban na-awachị ka ndị agha ha na-anara nrị na ebe obibi.

Mmachi ha machịrị ụmụ nwaanyị bụ mbụ ọ na-emetụta Nooria.

"Ọtụtụ mmachị dị ugbua, a ga m eyiriri Burka ma nwoke ga-eso m tupu m pụọ ezi".

Ịme njem dịka nwaanyị na-enyere ụmụ nwanyị na-amụ nwa aka siri ike ugba.

Anaghị ekwe ụmụnwoke kpụọ ntụtụ isi ha maọbụ afụ ọnụ ha.

Okpuisi anaghị akpụ kwa isi ha sị bụ nke ndị ọcha.

Ọ bụ otu Taliban bụ Ambri bil Marof (Order the good) na-ehiwe iwu ndị a.

Dịka ha siri yie egwu n'afọ 1990, ugbua ha ehiwela iwu ha. Nke mbụ bụ ịdọ aka na ntị, nke abụọ bụ ntaram ahụhụ - ime akaja, nga, iti ihe maọbụ ịpịa ụtarị.

"Na-emeghị eme, anapụla anyị nwereonwe anyị", dịka Nooria siri kwuo.

"O siri ike kama enweghị ihe anyị ga-emenwụ. Ha ji aka ike. Anyị na-eme ihe niile ha chọrọ ka anyị mee. Ha ji alakụba achọ ihe nke ha. Anyị bụkwa ndị alakụba kama nkwenye anyị na ha abụghị otu".

Enwekwara ihe ndị ọzọ ndị Taliban gbochiri.

Ọ na-amasị ndị mba Afghan ịme njem nlegharịanya na mpaghara Takhar maka ugwu ya, mmiri na sunoo.

Asif Ahadi bụ ọkwọọ ụgbọala kwuru na ọ na-enweta 900 Afghanis ($11; £8) n'otu ụbọchị. Kama ndị njem nlegharịanya kwụsịrị dịka ndị Taliban wuchiri.

"Ndị ọbịa a na-agba m aka ahịa," Asif, dị afọ 35kwuru,. O kwuru sị, " Ego ha na-akwụ m ka m ji elekọta ezinụlọ m. ugbua ụbọchị m rụtara ego bụ 150 Afghanis.Ego a anaghị ezurum ịzụ mmanụ ọkụ ụgbọala nke rigorola elu ugbua".

Ihe a metụtara etu ndị mmadụ si emekọ na mbụ. Sif kwuru sị, " Ndị mmadụ na-enwe anụrị n'abalị Frịde niile kama ihe ndị a niile akwụsịla".

" Ndị ojiego achụ ego nọ kwa na nsogbu a".

Asif kwuru na dịka ndị Taliban na-abata obodo ka ndị zoro onwe ha na-apụta. Ndị a pụtara dịka ha ahutubeghị etu ndị Taliban si achị ọchịchị ha.

Dịka Asif siri kwuo, "Ha na-ekpebi okwu na-egbughị oge ọkachasị ihe gbasara mpụ". " Ha na-ekpebi okwu n'ime ụbọchị ole na ole- enweghị onye na-echere ha aka mgba maka mkpebi ha".

Ha na-ana kwa ụtụisi "Taliban Usher' na Zakat nke bụ ụtụ ndị okpukpere Islam na-echi obi nke ha enye nke ruru passenti 10. Kama ndị Taliban emeela ya iwu.

Nke a mere ka ihe siere ndị mmadụ ike ma gụnye kwa na ego nrị na-arị kwa elu.

Asif kwuru sị, " Ndị mmadụ enweghị ego ọbụla, ọrụ adịghị ma enweghị ụzọ esi akpata ego ọbụla"

Jan kwuru sị, " Etu ha sị eme ma na-eche uche oge ọchịchị Emirate ha agbanweghị, ndị Taliban na-ekwu na ha ajụọla aja maka ọchịchị ha nke mere na ha agaghị atụhapụ etu ha sị achị".

O kwuru na ndị Taliban emechiela ụlọ akwụkwọ niile ma sị na ọmụmụ akwụkwọ niile ga-ehiwe isi na iwu Sharia nke Islam.

Nke a na-ebutere ndị bi n'obodo oke uche.

Ndị otu Taliban wehachịrị Panjwai nke dị n'okpuru ọchịchị Kandahar ebe ha bidoro n'ime ụbọchị abụọ dịka ndị agha US na NATO pụrụ n'ụbọchị anọ nke ọnwa Julai.

N'ime izuụka atọ ka ndị TAliban kwuru na ha jo oke ala Afghanistan ruru 90% ma jidekwa ihe ruru 85% mba ahụ.

Mgbe ndị Taliban chịburu site n'afọ 1996 ruo afọ 2001, ha machịrị ụmụ nwaanyị ịgụ akwụkwọ maọbụ nata ọgwụgwọ zuru oke.

Kamgbe ha pụrụ n'ọchịchị, umụ nwaanyị wehachiri ọrụ gọọmentị dị iche iche ma mejupụta ọkara n'ime ọkara ndị omeiwu mba ahụ.

NDị agha elu mba Amerịka na-akwado ndị agha gọọmentị Aghanistan mana a na-atụ anya na ndị agha enyemaka ndị fọrọ na mba ahụ ga-ala n'ụbọchị iri na otu nke ọnwa Sepụtemba.

Ụbọchị ahụ ga-eme ya afọ iri abụọ ncheta mkpamkpa 9/11 na mba Amerịka.

Mkpamkpa a mere ka ndị mba Amerịka wakpoo obodo Afghanistan ma chụpụ ndị Taliban n'ọchịchị maka ha dọkwara Osama Bin Laden na ndị otu al-Qaeda ndị ọzọ.

Jan kwuru sị, " Ị gaghị ewelite isi gị ma ọ bụrụ na ị chọrọ ị dị ndụ. ị ga-emeriri ihe ha kwuru. Ị nweghịke ikwu okwu kwugide ha. Ha kwuo Eee ị ga-ekwuriri eee. Ha sị mba ị ga-asịrịrị mba".

Ụ dịrị egwu a juru n'Afghanistan dịka Nooria siri kwuo sị, "Ọ ga-adị ka obi ndị mmadụ o deere duu, kama gị na ha kpaa nkata ịghọta na enwere ọtụtụ ihe na-echekasị ha n'obi. Anyị na-ekpe ekpere arịọ Chineke ka ọ wepụ ihe ndịa na-eche anyị uche".

Agbanwere aha ndị mere akụkọ a