Zicsaloma: Ọ dịghịrị m mfe ime ka ndị mmadụ kiriwe ihe ejije m mgbe m bidoro

Aha onyonyo, "Ọ dịghịrị m nfe ime ka ndị mmadụ kiriwe ihe ejije m mgbe m bidoro' - Sister Ekwutosi

Ị maara okorọbia ahụ na-eme ejije ka nwaanyị?

Isaac Aloma Junior (e ji Zicsaloma mara na soshal midia) gwara BBC Igbo ka o si malite ime ihe ejije ka ọ gụchara akwụkwọ ịbụ okaikpe nakwa asụsụ Englishi na Mahadum.

Ọ sị na akanchawa ya bidoro mgbe o malitere ịme ihe onyonyo.

Isaac sị na ihe kacha taa ya akpụ bụ ịme ka ndị mmadụ malite ikiri ihe ọ na-eme.

Kirie ka o si mezie ya bụ ihe tara ya akpụ.

Ndị mere akụkọ a: Chioma Nkemdilim Daramola, Vining Ogu na Nnamdi Agbanelo.