Children's Day: A malitere m ọrụ DJ mgbe m dị afọ ise - DJ Irish
Nwata a dị afọ isii bụ Eze Chikamso e ji DJ Irish maara kọwaara BBC Igbo etu o si malite ọrụ ịkwakọta egwu a na-akpọ Disc Jockey.
Ọ sị na ọ malitere inwe mmasị n'ọrụ a mgbe ọ dị afọ ise, mgbe nna ya zụtara udu egwu nwere ihe ndị DJ.
DJ Irish sị na ọ gwara nna ya ka ọ zụtara ya ihe DJ ma kpọtara ya onye nkuzi ga-enyere ya aka.
Nna ya mere nke a ma nyekwa ya nkwado ịmalite nkwọkọta egwu.
Nne Irish bụ Adaobi Eze sị na ọrụ ya dịka DJ anaghị emetụta agụmaakwụkwọ ya, na ọ bụ ya mere o ji akwado ya.
Kirie ihe ha kwuru n'uju;
Ndị mere akụkọ a: Ikechukwu Kalu na Nnamdi Agbanelo


