Otigba Junction: Obi dị m ụtọ na m rụgharịrị akpụrụakpụ a - Chris Chuba

Aha onyonyo, Otigba

Ọ bu n'oge Chris Chuba bụ nwata akwụkwọ na mahadum IMT dị n'Enugwu ka ọ rụrụ nka Otigba.

Ọ bu n'afọ 1981 ka o mere nke a tupu ndị ọchịchị ndị agha buru ya gawa ebe e mechara mara ka "Otigba Junction".

Ọ nọ ebe ahu ruo oge ndị na-eme ngagharịiwe Endsars jidere ya kụrịe.

Na onyonyo a, Maazị Chuba kowara BBC ihe o chere maka ọrụaka ya pụtara dịka nka so n'ime ndị akachasị mara n'Enugwu kemgbe ihe karịrị afọ 35.

O kwukwara ihe o chere maka etu gọọmentị esighi etinye aka na nrụgharị nka a.