Ibeawuchi Marshal: Etu nwata akwụkwọ ABSU sị nwụọ n'egwu bọọlụ a gbara ebe ahụ
Njinji jiri ụnyahụ na mahadum Abia State University di na Uturu dika otu nwata akwụkwọ ya bụ ụlọ akwukwọ nọ n’agba nke abụọ ya, Ibeawuchi Marshal nwụrụ ka ọna ayọrị ibara n’egwu bọọlụ ụnyahụ dika ọ sụrụ isi na ala.
Akụkọ kwuru na ụmụ akwọkwọ ibe ya butere ya na ụlọọgwụ ya bụ ụlọakwụkwọ bu Abia Steeti University Medical center mana na enweghi ezi akụrụgwa eji agwọ ọria tinyekwara enweghi mmanụ eji akwọ ọgbọala ọnọdụ gbatagbata so tinye aka na ọnwụ ya.
Mana onyeisi ụlọọgwụ ahụ bụ Dr. Akara kwuru na ya bụ nwata akwụkwọ nwụrụ notu ntabianya na ogbe ahụ onwere ihe mberede.