Lee ihe nọ n'ụlọ Mungo Park n'Asaba
Ndị na-arụ n'ụlọọkpụ Mungo Park akọwaala etu ụfọdụ ndị ọcha dịka Mungo Park si bata na mpaghara osimiri Naịja nke ala Igbo tupu e kpokọta Naịjirịa ọnụ.
Otu n'ime ndị nlekọta a bụ Okongwu Nnenna sị na ọ bụghị Mungo Park chọpụtara osimiri Naịjia dịka akụkọ si ekwu kama na ọ gbara mbọ ka ọ chọpụta ebe osimiri Naịja bidoro.
Ọ gara n'ihu kwuo na Mungo Park na ndị otu ya nwụrụ mgbe ụgbọmmiri ha kpuru ebe ha na-achọ mbido osimiri a.
Okongwu gara n'ihu sị na e mechara umunne abụọ a kpọrọ 'Lander brothers' mechara bata na mpaghara osimiri Naịja.
Kirie ihe niile ọ kọọrọ BBC Igbo n'uju.
Ndị hụrụ maka akụkọ a: Chris Sanctus Okereke na Chiemela Mgbeahuru