Ned Nwoko: Izu ụka a bụ nke Laila Charani nwunye m bụ onye Morocco

Ned Nwoko na nwunye ya nke ise akpọrọ Laila Charani wuru ewu na ngwụcha izu ụka a dịka o tinyere foto nwunye ya ma na-ekele ya dịka Laila gbara afọ iri atọ.

Ned kwuru na o ruola afọ iri ọ matara Leila nwunye ya, ma na-agwa ya ka o kele chukwu maka ndụ makana ndụ kacha.

Ihe onyonyo na-efegharị na soshal midia na-ekwukwa na Ned gonyere nwunye ya a nnukwu ụgbọala nakwa ọla aka elekere galara ọnụ mana anyị amaghị maọbụ eziokwu.

Ihe ise i maghị maka Ned Nwoko na Regina Daniels

Aha Ned Nwoko na Regina Daniels na-akpọtụ na social media mana ị ma na o nwere ọtụtụ ihe ị mabeghị maka ddi na nwunye a na-ewu ewu?

Lee ise n'ime ha ebe a:

1. Ọ bụ ọkaiwu soro nye aka ịhụ na Naijiria nwetaghachikwara ego Paris Club oge ọchịchị Olusegun Obasanjo.

2. Ned, onye bụ nwaeze obodo Idumuje dị n'Okpuruọchịchị Aniocha, Delta steeti alụọla Nwaanyị ise (nke ise bụ Regina Daniels), mụọ ụmụ 18, mana ọ hụrụ ụmụaka n'anya nke ukwuu nke ọ na-ele anya ịmụkwụ ụmụ ọzọ.

3. Nwoko bụ onye na-amakarị njakịrị maọbụ na-akpakarị ọchị ma bụrụkwa onye na-ajụkarị ajụjụ ma ọ bụrụ na i zute ya.

4. I nwere ike ịma na Ned gara mahadum na mba Briten ebe ọ nọ rụọ ọrụ ọkaiwu ya ihe karịrị afọ 30 mana ị ma na ọ gara sekọndịrị n'ala Igbo? - Ọ gụrụ akwụkwọ n'Abbot Boys Sekọndịrị, n'Ihiala dị n'Anambara steeti.

5. Ụfọdụ ndị a na-akpọkarị aha na-eme ka ha na-ewu ewu na soshal midia dịka ndị a sị bụ nwunye ndị ọzọ Ned na-alụ, bụ ndị enyi Regina Daniels maọbụ ndị na-enyere ya aka n'ọrụ ya.

Ned Nwoko: Ịlụ otu nwaanyị abụghị omenala Igbo

Ned Nwoko ekwuola na o kwenyeghị na nwoke na nwaanyị ime ọyị ogologo oge tupu ha alụọ di na nwunye.

Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo, ọ kọwara na ya na nwunye ikpeazụ ya bụ Regina Daniels zutere onwe ha ma lụọ onwe ha n'ime izuụka atọ.

Ọtụtụ mmadụ ma Ned Nwoko dịka onye omeiwu na anọchitebu Aniocha/Oshimili n'ụlo Omeiwu n'Abuja ma bụrụkwa di omeejije Regina Daniels.

Mana, Ned, nke ezigbote aha ya bụ Chinedu, bu onye chịtara aja ọfụma n'ọrụ ọkaiwu bụ ebe ọ gwara BBC Igbo o siri kpata ego mere ya nde ego na dọla.

Ọ gbara ama echiche ya banyere alụmdinanwunye ya na Regina, ịlụ ụbara nwaanyị na ihe ndị ọzọ.

Lee akụkọ a n'uju n'elu:

Ndị mere akụko a bụ Uche Akolisa na Nnamdi Agbanelo

Akụkọ ndị ga-amasị gị