'Ihe mere m jiri ntu ese ihe mara ezigbote mma'

Onyinye Ezennia bụ ezigbote onye nka na eji ntu obele obele na owu ese ihe mara ezigbote mma.

Dịka o siri kwuo, ọ na-eji ntu ruru 5000 ese eserese ya.

Ọ sịkwa na ọ na-ewe ya ihe ruru izuụka abụọ iji mepụta otu nka.

O kọwara na ihe mere o ji esakari ụmụnwaanyị bụ iji gbaa ụmụnwaanyị gabigara ihe mgbawa obi ume.

Ọ na-eme ihe enweghị aha iji mee ka ndị mmadụ mata maka mgbanwe eluigwe.

Akụkọ a si n'aka Chiemela Mgbeahuru