Africa Eye: Ihe nkiri gosiri etu ndị ohi nwa si ezu kịrị kiri ụmụaka n'aka nne ha
Ohi nwa eteela ọ malitere n'akụkụ ụfọdụ mba ụwa mana nsogbu na-apụtakịrị na ya bụ na anaghị eji ike amata ndị na-akpakarị mkpa mkpa a.
Ohi nwa dịka ọ na-aghọzi ihe ọzọ na mba Kenya dịka onye ntakụkọ BBC si chọpụta.
Ihe nkiri a gbara ama ụfọdụ ndị na-ezu ohi nakwa etu ha si ezute ụmụaka ha na-eresi ndị chọrọ izụta nwa.
Onyeisi Missing Child Kenya bụ Maryana Munyendo kwuru na nsogbu na-eso amụghị nwa ma nwaanyị lụcha di so ebutekwa ozuzu nwa na Kenya.
Kirie ihe nkiri a ka ịmata ihe niile a n'uju.


