"Ahụhụ ka anyị na-ata ugbua" - Ndị Ogbaru ide mmiri chụpụrụ na be ha
"Ahụhụ ka anyị na-ata", "gọọmentị nyere anyị aka" na ihe ndị ọzọ bụ akwa ndị gbara ọsọndụ maka idemmiri na-ebe.
Ndị ahụ si n'obodo Ogbaru, Atani nakwa Odekpe nọzi n'ogige gọọmentị wepụtara maka ịgba ọsọ ndụ ugbua.
N'agbanyeghi nke a, ha ka na-ata ahụhụ n'ihi na gọọmentị ekesabeghi ihe ndị gbatagbata a ga-eji nyere ha aka rue ugbua.
Lee ihe ha gwara BBC Igbo n'uju.
Ọrụ a si n'aka Nnamdi Agbanelo na Ebere Ekeopara