Akụkọ ndị dị mkpa: Mmadụ 20 ka na-efu na idemmiri Katsina steeti.

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Akụkọ ndị dị mkpa:

Onye na egwu ide mmiri

Mmadụ ruru iri anọ n'anọ anwụọla na Ide mmiri kworo n'obodo Jibia na Katsina steeti ma kwakpịa ụlọobibi ruru narị ise.

Aka na-achị steeti ahụ bụ Aminu Masa gwara ndị ntaakụkọ na-aka na-achọ mmadụ iri abụọ dịka ndị na-efu efu.

Ọzọ na Naịjirịa

Onye ọrụ Inec
Nkọwa foto, Ndị ọrụ Inec gosikwara njikere ha dị ibido ihe ha bịara

Otu na-ahụ maka oke ruru mmadụ nakwa ezi ọchịchcị edegarala ngalaba na-ahụ maka ntuliaka bụ INEC akwụkwọ.

Onyeisi otu a bụ Adetokunbo Mumuni gwara INEC ha nyochaa ebubo nrụrụaka mere na ntụliaka INEC nakwa kpee ndị ikpe mara ikpe iji chekwa ọchịchị onye kwuo uche ya.

Na mba ofesi,

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post

Otu ụlọịkpe na mba Briten amaala Stephen Searle bụ onye Kounselọ ịkpe maka ọnwụ nwunye ya.

Echere na Stephen tọgburu nwunye maka na ọ chọpụtara ma mmekọ dị n'etiti ya na nwaanyị ọzọ bụ nwụnye nwa ha nwoke.

N'Egwuregwu,

Ahmed Musa

Ebe foto si, Getty Images

A na-anụ kepu kepu n'ọfọrọ obere ihe ka Ahmed Musa onye ọgba bọọlụ Naịjirịa tinye aka ị sonye otu egwuregwu Al Nassir nke Saudi Arabia,

Ọbụrụ na ọ gaa ihu nke a ga-eme ya onye ọgba bọolụ Afịrịka akachasị akwụ ụgwo.

Gee nkeji nke mgbede a

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Ihe onyonyo nke taa

Aha onyonyo, Nwagbọghọ ji otu ụkwụ agba egwu