Okpu Agọrọ: Ị ma ihe etu esi yie ya pụtara?

Okpu agọrọ bụ okpu ndị Igbo ji aga mba ma bụrụkwa okpu njirimara ndị Igbo ebe ọbụla ha gara.

Onye ukwu na onye nta na-ekpu ya dịka ọ maghị eze ka ọ na-ama onye ohu.

Ihe onyonyo a na-egosi etu e si eyi ejiji a eji mara ndị agha gboo nakwa ndị agba ọhụrụ chọrọ ka eji Igbo mara ha.

Ọ bụ Uche Akolisa na Vining Ogu mere akụkọ a.