Etụ gọọmentị Naịjirịa ga-esi họpụta mmadụ 774,000 ha chọrọ iwe n'ọrụ
Onyeomeiwu bụ Toby Okechukwu akọwala iwe ndị omeiwu nta maka ọrụ gọọmentị etiti chọrọ iwe na atụmatụ "Special Works Programme" (SWP).
Cheta na-agbanyeghi na ndị omeiwu Naịjirịa sị ka ewezuga mkpebi gọọmenti iwe mmadu 774,000 n'ọrụ site na SWP, na minista na-ahụ maka ọrụ bụ Festus Keyamo, bụ onye atụmatụ a dị n'aka sị na ọ ga-aga n'ihu.
Keyamo na ngalaba ụlọomeiwu Naịjirịa na-ahụ maka ọrụ nwere nghọtaghie n'ụbọchị Mọnde dika ha na-eme mkparitaụka banyere atụmatụ a.
Ndị omeiwu sị na Keyamo akwanyereghi ha ugwu dịka nzukọ ahụ na-aga n'ihu, ma mechaa sị ya si ebe ahụ ha nọ pụọ.
Keyamo na onwe ya sị na nke ahụ abụghị eziokwu. Ọ si na ihe na-ese okwu bụ na ya chọrọ ka a kpaa nkata banyere iwe n'ọrụ a n'ihu ndị ntaakụkọ, mana ndị omeiwu chọrọ ka ọ bụrụ na nzuzo.
Dịka ọ kwụ ugbua, ndị omeiwu, site n'ọnụ onyeisi kọmitii ahụ bụ Muhammadu Alli Wudil, sị na iwe n'ọrụ ahụ kwụsịgodu makana obi akaghị ha etu esiri chọọ ime ya.