Flu Virus: 'Bird flu', swine flu, SARS na ọrịa ndị ọzọ mara ụwa jijiji

    • Onye dere ya, Jessica Nwankwo
    • Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist, BBC Igbo, Lagos

Ndị ọrụ sayensị na Chaịna achọpụtala ụdịrị ọrịa ụkwara ọhụrụ nwereike ị zu ụwa ọnụ.

A chọpụtara ọhụrụ n'ahụ ezi mana o nwereike ị fee ndị mmadụ dịka ha si kwuo.

Dịka ọ dị ugbua ndị ọrụ ahụ na-eche na o nwereike ịgbanwe ma ghọrọ ọrịa ga-efe efe ma zuo ụwa ọnụ n'oge adịghị anya.

Akpọbeghị ọrịa aha ọbụla ugbua mana lee ọrịa ndị ọzọ yiri ya mara ụwa jijiji ebe a:

1. "Spanish Flu"

Ọrịa a malitere n'afọ 1918 mgbe a na-anụ agha ụwa nke mbụ bụ WW1 bụ nke metụtara ngụ ndị mmadụ.

Ọ bụ ọrịa a tụrụ egwu nke ukwu n'ihi na o gburu ugboro abụọ ọnụọgụgụ ndị nwụrụ n'agha ahụ, ya bụ ihe ruru mmadụ nde iri ise nwụrụ.

A kpọrọ ya "Spanish Flu" mana ndị sayensi niile ekweteghị n'aha a n'ihi na rue ugbua, amabeghi ebe o si welite isi.

2. "Asian Flu"

Ọrịa nke a malitere n'afọ 1957 na mpaghara ọwụwa anywanwụ Eshia dịka aha ya si kwuo.

Ọ pụtara n'ahụ nnụnụ tupu o bido i fee ndị mmadụ dịka ọrịa ụkwara nakwa ngụ.

O gburu ihe ruru mmadụ otu nde na ọma n'ụwa niile

3. Hong Kong Flu"

Nke a yiri ọrịa "Asian Flu" n'ihi na o si kwa n'ahụ nnụnụ pụta ma bụrụkwa ọrịa ngụ.

O gburu ihe ruru mmadụ otu nde n'ụwa ma siri kwa na Hong Kong pụta dịka aha ya si gosi.

O bu ụzo senyie isi n'afọ 1957.

4. SARS

Ọrịa SARS pụtara "Severe Acute Respiratory Syndrome" na Bekee maọbụ ọrịa ike nke ngụ malitere n'afọ 2002.

A chọtara n'ahụ ụsụ n'Eshia ebe o fere mmadụ puku asatọ na ọma.

Ọ malitere iwu ọzọ n'ihi na ngosiputa ya yiri nke Covid-19 na-ewu ugbua.

5. "Swine Flu"

Ọrịa ngụ nke a malitere n'ahụ ezi na mba Amerịka metụtara ụmụaka na ndị ntorobia kachasị.

E chere na o fere ihe ruru mmadụ nde narị asatọ ma gbuo mmadụ puku narị abụọ na iri asatọ na anọ.

E bu ụzọ chọpụta ya n'afọ 2009.

6. MERS

Ọrịa MERS pụtara "Middle Eastern Respiratory Syndrome" na Bekee bụ ọrịa echere na ọ pụtara n'ahụ ụsụ.

A kpọrọ ya MERS n'ihi na ọ bụ na mba Saudi Arabia ka o si malite ma fesaa na mba iri abụọ na ise.

Ngosiputa ya yikwara nke SARS nakwa Swine Flu n'ihi na ha niile si n'otu ezinaụlọ nje.

7. COVID-19

Covid-19 bụ ọrịa nke ụwa nille ka na-agba mgba rue ugbua.

A chọpụtara mbụ n'ọnwa Disemba afọ 2019 n'obodo Wuhan dị na mba Chaịna.

O nwetara aha ya n'ihi na o si na ezinaụlọ nje akpọrọ "coronavirus" ma malitekwa n'afọ 2019 (Covid-19)

Dịka ọ dị ugbua, o feela ihe karịrị mmadụ nde iri ma gbuo ihe ruru mmadu puku narị ise.

Akụkọ ndị ga-amasị gị