Biafra: Ihe Ipob na Massob chọrọ - T.A Orji

Onye bụbu Gọvanọ Abia steeti ma bụrụkwa sinetọ na-anọchite anya Abịa Sentralụ bụ Theodore Ahamefula Orji, ekwuola uche ya banyere Indigenous People of Biafra (Ipob) na Movement for the Actualisation of Sovereign State of Biafra (Massob) na nweta Biafra.

Nke a dị n'ajụjụ ọnụ BBC Igbo gbara ya n'Umuahia, Abia Steeti n'ụbọchị iri atọ nke ọnwa Mee, afọ 2019.

Ọ sị na otu ihe mere ndị otu dịka Massob na Ipob ji na-eti mkpu mmegbu bụ na onye Igbo abụbeghi onyeisiala Naịjirịa.

Na ọ bụrụ na e nye ndị Igbo ọkwa onyeisiala, na ihe ndị a ga-akwụsị maọbụ dajụọ n'ebe ọ dị obere.

Orji gara n'ihu rụtụ aka na nhazigharị obodo bụ ihe e kwesịrị ime iji mee ka ihe dị mma karịa ka ọ dị ugbua.

O kwuru na ọ ga-adị mma ka gọomentị etiti hapụ ụfọdụ ihe dịka uweojii ka ndị steeti jide nke ha.

Kirie ihe o kwuru n'uju;

Akụkọ ndị ga-amasị gị: